Upload
others
View
2
Download
1
Embed Size (px)
Citation preview
MMETA NKE ỌMA N’ỤTỌASỤSU N’ULE SEKỌNDỊRỊ: NTỤLE ULE ỤMỤ AKWỤKWỌ ASỤMABỤỌ NA ZOONU MMỤTA NSỤKA
DỊ NA STEETI ENUGWU
NKE SI N’AKA
EWELUM CHINYELUM PG/M.ED/06/40807
DEPARTMENT OF ARTS EDUCATION UNIVERSITY OF NIGERIA, NSUKKA
ONYE NLEKỌTA: ỌKM. ORK. UJU UMO
Nọvemba 2010
MMETA NKE ỌMA N’ỤTỌASỤSU N’ULE SEKỌNDỊRỊ:
NTỤLE ULE ỤMỤ AKWỤKWỌ ASỤMABỤỌ NA ZOONU MMỤTA NSỤKA DỊ NA STEETI ENUGWU
NKE SI N’AKA
EWELUM CHINYELUM PG/M.ED/06/40807
DEPARTMENT OF ARTS EDUCATION UNIVERSITY OF NIGERIA, NSUKKA
Nọvemba 2010
i
ISI OKWU
MMETA NKE ỌMA N’ỤTỌASỤSU N’ULE SEKỌNDỊRỊ: NTỤLE ULE
ỤMỤ AKWỤKWỌ ASỤMABỤỌ NA ZOONU MMỤTA NSỤKA DỊ NA
STEETI ENUGWU
ii
NHUNYERE
Ana m ehunyere Chukwu Nna onye pụrụ ime ihe niile ederede a maka
agbamume ya ruo na ngwụcha nchọcha.
Ana m ehunyekwara ya ndị mụrụ m bụ Maazị Onyekaozulu Chinenyeike
Agụ (nke laalara mụọ ka mkpụrụ obi ya zuru ike na ndọkwa. Amen) na Ork
Virginia Enyivuakụ Agụ ndị malitere ọrụ ọma a na ndu m.
Onye ọzọ m na-ehunyekwara ederede a bụ ezigbo di m bụ Maazị Adolphus
Chukwuma, Ewelum bụ onye na-enye nkwado mgbe ederede a na-aga n’ihu na
ụmụaka m bụ Obinna, Kosisọchukwu, Chinwekene, Ifeanyịchukwu, Chisom,
Chukwuma na Chidalụ.
iii
OZI EKELE
Ana m enye Chukwu Nna, Chukwu Nwa na Chukwu Mụọ Nsọ ekele maka
otu ha si duo m ruo na ngwụcha ihe ọmụmụ a, tụmadị mgbe ekwensụ kwadoro
ịnara m ndụ n’ike site n’ihe mberede nke okporo ụzọ. Chineke ekweghị ka ajọ izu
ya mezue. Ekele dịrị Jesu, Amen.
Ana m ekele ezigbo di m bụ Maazị Adolphus Chukwuma Ewelum na
ụmụaka m bụ Obinna, Kosisọchukwu, Chinwekene, Ifeanyịchukwu, Chisom,
Chukwuma na Chidalụ bụ ndị ọ na-asọ ụsọ ịhụ na m nwetara nzere Masters ma
gụrụ gaba n’ihu. Ka Chineke gozie ha, Amen.
Ana m ekele n’ụzọ pụrụ iche onye ntuzi aka m n’ederede a bụ Ọkm Uju
Ụmọ maka ntuzi aka, nkwado nakwa enyemaka n’ụzọ ọbụla n’oge edemede a na-
aga n’ihu. Ndị nkuzi m ọzọ m chọrọ ka ekele m gara bụ Ọkm P.N. Ụzọegwu,
Ọkm. J.U Akabọgụ na Ọkm Monica Omeje. Ka Chineke gozie unu. Ndị ọzọ bụ
ụmụ akwụkwọ ibe m bụ Maazị Cajetan Egbe na Cletus Ugbor, ka Chineke
nọnyere unu, Amen.
Ndị ọzọ ekele m na-agara bụ Ọkm Onyemaechi Mba na Ọkn. Innọ Ụzọma
Nwadike bụ ndị nkụzi m na ngalaba Lingwuistiks, Igbo na Asụsụ Naijirịa. Ngọzị
dịrị Ọkm Onyemaechi Mba. Ya bụ onye gbara m ume ka m dee ederede a n’Igbo.
Echefughị m ụmụnne m bụ ndị na-agba m ume n’ụzọ ọbụla ịhụ na m na-
aga n’ihu. Ha bụ Rose, Francis, Josephine, Tonia, Ejima m bụ Patrick,
Chikwendu, Chinasa, Sunday an Chịdị. Ka Chineke gọzie ma na-echekwaba unu
niile, Amen.
iv
ỤMỊ NCHỌCHA
Ebunuche nchọcha a bụ ịmata mmeta nke ọma n’ụtọasụsụ Igbo n’ule sekọndịrị skuul n’okpuru ọchịchị Nsụka Edukeshọn Zoonu. Ebunuche ihe ọmụmụ a bụ ịchọpụta nsogbu dịrị ụmụ akwụkwọ sekọndịrị skuul mmeta nke ọma n’ụtọasụsụ Igbo n’ule akwụkwọ ha. Ihe onye nchọcha chọpụtara ga-enye aka ime ka ndị nkuzi na ụmụ akwụkwọ nwee mmasị n’ikụzị na ọmụmụ asụsụ Igbo na sekọndịrị skuul na Nsụka Edukeshọn Zoonu tụmadụ na mmeta nke ọma n’ụtọasụsụ n’ule sekọndịrị skuulu. Usoro nchọcha bụ ụlọ akwụkwọ dị n’ime obodo na obodo mepere emepe dị n’okpuru ọchịchị Nsụka. Ọnụ ọgụ ụlọ akwụkwọ ahụ dị iri ise na itoolu. N’ime ụlọ akwụkwọ onye nchọcha weere ụlọ akwụkwọ itoolu ọnụọgụ ha dị narị anọ, iri ise na asatọ wee mee nchọcha. Ụmụ akwụkwọ ahụ na-agụ sịnịọ sekọndịrị skuulu II. Usoro nchọcha ihe ọmụmụ a bụ ntụcha nke e ji pesenteeji wee mee. Rizọọlt na-egosi na:
(a) ụmụ akwụkwọ enweghị mmasị n’asụsụ epum ha. (b) e nweghị ndị nkụzi azụrụ nke ọma n’akụzi asụsụ Igbo n’ụlọ akwụkwọ
sekọndịrị skuul (ch) ndị nkụzi gụrụ maka asụsụ Igbo ji Bekee akọwa Igbo. (d) ndị nkụzi anaghị aga ọgbakọ, nchọcha, njem nlere anya mara ngbanwo dị n’asụsụ Igbo ma kuziere ha ya ụmụ akwụkwọ Onye nchọcha nyere atụmatụ ọma ga-enye aka ime ka asụsụ Igbo bụrụ akwaa akwụrụ n’ebe ụmụ akwụkwọ Igbo nọ. Ọ sị na a ga-ebido n’akwụkwọ ọtaakara kuzibere ụmụ akwụkwọ asụsụ Igbo na Bekee ga na-abịa mgbe ọ bụ Bekee ka a ga-akụzi. Onye isi ụlọ akwụkwọ ga-amapụta atụmatụ maka ọgbakọ, nchọcha, nlere anya maka ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ. Nke a ga-enye ha obi siri ike na o nweghị asụsụ ka ibe ya. Ndị nne na nna ga-enye aka sụbara ụmụaka ha asụsụ Igbo n’ụlọ. Mgbe a gbasoro usoro ndị a, a mara na asụsụ Igbo ga-abụ akwaa akwụrụ.
v
NDỊNA
ISI NKE MBỤ: MKPỌLITE
Isi Okwu - - - - - - - - i
Nhunyere - - - - - - - - ii
Ozi Ekele - - - - - - - - iii
Ụmị Nchọcha - - - - - - - - iv
Ndịna - - - - - - - - - - v
Ntọala Nchọcha - - - - - - - - 1
Nsogbu Nchọcha - - - - - - - - 7
Mbunuche Nchọcha - - - - - - - - 8
Uru Nchọcha - - - - - - - - 9
Oke Nchọcha - - - - - - - - 10
Ajụjụ Nchọcha - - - - - - - - 10
ISI NKE ABỤỌ: NTỤLEGHARỊ
Ntulegharị a gbadoro ụkwụ n’isiokwu na nkebi isiokwu:
Nkọwa ọkpụrụkpụ okwu - - - - 12
Ọnọdụ asụsụ Igbo na Naịjirịa - - - - 11
Asụsụ - - - - 14
Mmamasụsụ - - - - 15
Ụtọasụsụ - - - - - 17
Atụtụ Nchọcha - - - - - 21
Atụtụ ọkwa Mmụta - - - - 21
Atụtụ okwu Ụbụrụ - - - - 23
Ntụlegharị Ederede - - - - - 23
Nsogbu dịrị ụmụ akwụkwọ Igbo N’ọmụmụ Asụsụ Igbo - - 23
Ndị ka eme nke ọma n’ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị n’asụsụ Igbo. - 26
Ebe Nye Mmamasụsụ - - - - - - 28
Nchịkọta Ntụlegharị - - - - - - - 28
vi
ISI NKE ATỌ: USORO NCHỌCHA
Ụdị Nchọcha - - - - - - - - 31
Ebe Nchọcha - - - - - - - - 31
Ndị Njirime Nchọcha - - - - - - - 32
Nhọpụta Na Usoro - - - - - - - - 32
Ngwa Nchọcha - - - - - - - - 32
Nnyocha Nchọcha - - - - - - - - 33
Usoro Nnweta Ihe E ji Mee Nchọcha - - - - - 34
Usoro Nhazi Nchọcha - - - - - - - 34
ISI NKE ANỌ: USORO NHAZI NTỤCHA DATA - - - 35
ISI NKE ISE: NHAZI IHE A CHỌPỤTARA
Nkata - - - - - - - - 42
Mkpokọta - - - - - - - - 44
Ihe ga-apụta - - - - - - - - 45
Atụmatụ maka Nchọcha Ọdịnihu - - - - - 46
Ebe Nchọcha Kwusịrị - - - - - - - 47
Ebe Ndị Ọzọ E Nwere ike Ime Nchọcha - - - - 48
Nchịkọta - - - - - - - - 48
EDEMSIBỊA - - - - - - - - 54
1
ISI NKE MBỤ
MKPỌLITE
Ntọala Nchọcha
Asụsụ bụ ihe mmadụ zuru oke na mmadụ nwere ike iji wee mebe okwu
maọbụ jiri ya dee ihe. O nweghị ihe e kere eke nwere ike iji asụsụ mebe okwu
maọbụ jiri ya dee ihe ma ọ bụghị mmadụ. Asụsụ bụ ihe jikọtara okwu, echiche
maọbụ onyonyo dị mmadụ n’echiche nke na-eme ka mmadụ nwee ike ikwupụta
echiche ya maọbụ ikọwa ihe mmadụ kwuru.
Na mgbaso ụkwụ Mgbodile (1999) asụsụ n’usoro mmụta edukeshọn bụ
ịghọta ihe asụsụ bụ na uru ọ bara na mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Iji kwado ihe o
kwuru, ọ bụ eziokwu maka na e wezuga asụsụ, o nweghị uru ọ bara mmadụ na
mmad ụ ibe ya imekọta. Dịka Brooks si rụtụ aka n’akwụkwọ Azikiwe (1998),
asụsụ bụ ihe a na-amụ n’usoro kwesiri ekwesi dịka omenala ndị siri dị n’ụdị ọ siri
gbasata mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Naldman, 1971 gbasokwara ihe Brooks
kwuru n’akwụkwọ Huxley na Ingram, 1989 mgbe ọ sịrị, asụsụ bụ mkpọkọba okwu
n’usoro echiche mmadụ siri dị nke ndị mmadụ ga-esi na ya gbado ụkwụ na
mmekọrịta mmadụ na ibe ya.
Asụsụ dịka Fendinand de Saussure 1995 na akwụkwọ Hartzeler 1965 bụ
nkwekọrịta ndị mmadụ kwekọrịtara n’obodo, nke ga-enye aka ịgbasa usoro iwu
mmekọrịta mmadụ na ibe ya ndị kwere n’otu omenala.
Maka mkpa ọ dị n’ịsụ asụsụ, o kwesịrị ka nwa afọ Igbo mara asụ asụsụ
Igbo nke ọma ma makwara ede ya ede n’amaghị jijiji maọbụ mee nkụja ọbụla. O
2
nweghị nwa afọ Igbo nwere ike ịsụ asụsụ Igbo nke ọma n’etinyeghị ya Bekee. Nke
kachasị mwute bụ na ha enweghị ike ide asụsụ ha nke ọma. Ụfọdu nne na nna
ekweghị ka e jiri Igbo na-akụziri ụmụ ha ihe nke ụmụ ha ji asụ Igbo n’ụlọ maọbụ
n’ụlọ akwukwọ. Ndị mmụta akwụkwọ tiri iwu si na bido n’akwụkwọ ọtaakara ruo
na klaasị nke atọ ka a ga-eji asụsụ epum kụziere ha ihe ma asụsụ Bekee ga-abịa
mgbe ọ bụ Bekee. Mana nke a abụghị maka ụmụ afọ Igbo.
Ihe ndị a bụ ihe na-ebụtere ụmụ akwụkwọ na asụ Igbo emeghị nke ọma
n’ule Igbo ha n’ule nzere mmụta ‘West African Senior School Certificate
Examination’ na ‘National Examination Council’. Nkọwa ndị ‘chief examiners’
(2008) na ‘West African Senior School Certificate Examination’ na-gosi na ụmụ
akwụkwọ anaghị etinye uche n’asụsụ Igbo maka na ha were ya na o nweghị ebe e
ji asụsụ Igbo aga, na asụsụ Bekee bụ ebe a nọ. Ha kọwakwara na ike kwa, na ndị
nkụzi ji Bekee na-akụzi asụsụ Igbo mere na ụmụ akwụkwọ enweghị ike ịgụcha ihe
a sịrị ha gụọ tupu ule akwụkwọ.
O wee na-agbagoju onye nchọcha anya maọbụ na asụsụ ụmụaka a na-asụ
n’ụlọ abụghị nke e ji akụziri ha ihé n’ụlọ akwụkwọ ka ọ bụ na akwụkwọ e ji
akụziri ha ihe adabaghị adaba n’usoro mmụta Igbo n’ụlọ akwụkwọ. Maka ihe a
na-eme ka onye nchọcha ji wee gbado ụkwụ lebee anya n’ụtọasụsụ. Nwata
akwụkwọ Igbo ga-ama ụtọasụsụ Igbo nke ọma, nke ga-enyere ya aka ide Igbo nke
ọma. Onye nchọcha lebara anya na jenda, ibi n’ime obodo na ibi n’obodo mepere
emepe nke na-enyekarị aka n’ịmata ụtọasụsụ.
3
Asụsụ Igbo bụ otu n’ime asụsụ atọ e wepụtara dịka asụsụ ala Naịjirịa a ga-
akụzi n’ụlọ akwụkwọ ọtaakara, sekọndịrị, kọleeji edukeshọn na mahadum
(Ikekeọnwụ, 2007). Ọtụtụ atụmatụ ka gọọmenti etiti Naịjirịa sitegoro n’aka
ngalaba ụlọ ọrụ ya na-ahụ maka mmụta nakwa site n’ụlọ ọrụ nkwalite ọmụmụ na
nchọcha (NERDC) weputa iji mee ka a na akụzi asụsụ ndị a nke ọma. Oge ụfọdụ,
atụmatụ ọma ndị a na-ama afọ n’ala maọbụ nwee nsogbụ site n’enweghị ezigbo
akwụkwọ, ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ a ga-eji kụzie ma mụọkwa asụsụ ndị a.
Ebe ọzọ ọmụmụ asụsụ Igbo pụtara ihe bụ na West Indies. Ọ bụ Oldendrop,
bụ onye bịara njem nchịkọta ihe ọ ga-eji mee ihe akụkọ mgbe ochie nọrụ nwee
mmasị n’omenala, mmalite na asụsụ ndị ohu nọ ebe ahụ na-asụ. N’ihi nke a,
nwoke a malitere lebawa anya n’ụdị asụsụ ndị ohu a na-asụ. N’afọ 1777 ka
Oldendrop wepụtara akwụkwọ ya ọ kpọrọ Geschichte der Mission der
Evangelischen Bruder auf den Carabischem. N’ime akwụkwọ ya, e nwere ụfọdụ
mkpụrụ okwu Igbo, ọnụọgụgụ Igbo, Mkpọaha Igbo nke dị iri na atọ n’ọnụọgụgụ
tinyekwara ahịrịokwu abụọ a tụgharịrị n’asụsụ Igbo. (Ụtazị Dave Okechukwu,
1998). Onye ọzọ deturu mkpụrụokwu Igbo bụ Olaudah Equianọ n’afọ 1789.
Mkpụrụokwu Igbo a o wepụtara dị iri asaa na itoolu. (Ọraka, 1983). N’afọ 1828,
Ọrịakụ Hannah Kilham bụ onye nkụzị bipụtara akwụkwọ ọ kpọrọ Specimens of
African Languages. Mkpọaha dị iri ise tinyekwara ọnụọgụgụ Igbo (Ọraka, 1983).
Onye ọzọ chịkọbara okwu Igbo bụ MacGregor Laird n’afọ 1837. Mkpụrụokwu
Igbo o kpokobara dị iri asaa. (Dave Okechukwu, 1998). Ka ọganihu mmepe ụfọdụ
ka na-aga n’ihu n’asụsụ Igbo, otu nwoke a na-akpọ J.F. Schon Chịkọbara okwu
4
Igbo dị puku iri ise n’ọnwa itoolu nke afọ 1840. (Ọraka, 1983). O rue n’afọ 1841,
ọ chọrọ ijiri okwu Igbo nye nkọwa n’Igbo, ma Eze ndị Abọ kparịrị ya maka na ọ
sụtaghị Igbo ya nke ọma. Nke a mere o jiri hapụ asụsụ Igbo wee lebe anya n’asụsụ
nke ndị Awụsa (Nwadike, 2002). Onye nchọcha wee na-asị maọbụ ihe a merenu
mere na ndị Igbo enweghị ike ịsụ asụsụ ha nke ọma dịka ndị Awụsa na Yoruba si
asụ asụsụ ha ma ha nọkọọ ọnụ. Ihe mere na asụsụ Igbo enweghị ebe ọ gbadoro
ukwu bụ na Rev. Metcalfe Sunter bịara ilebe anya ka mmụta sị aga na 1884 wee
kwuo na asụsụ Igbo bụ asụsụ ndị iberibe na o nweghị uru ọ bara na mmekọrịta
mmadụ na ibe ya. Ma ọ bụrụ na a ga-akụzi Igbo, a ga-eji Bekee dee ya (Nwadike,
2002).
Mpụrụ okwu mbụ Igbo pụtaranụ bụ Nsibidi tupu ndị Bekee abịa ala anyị.
Nsibidi bụ ederede e ji osise wee dee. Ịma atụ:
di na nwunye.
Maxwell 1904 bụ onye mbụ Bekee mara maka nsibidi mgbe ọ bụ onye
nlekọta ihe ọmụmụ na Calaba. O rue n’afọ 1905, o wepụta akara nsibidi dị iri abụọ
na anọ n’ọnụọgụ (Ọraka, 1983). MacGregor 1909 gwara ụmụ akwụkwọ ya
n’obodo Nịajirịa enweghị mkpụrụ okwu e ji ede ihe ma. Ma nwata akwụkwọ sịrị
ya mba na e nwere mkpụrụokwu nke a na-akpọ nsibidi ma amatabeghị akụkụ
obodo nsibidi bidoro (Ọraka, 1983). Nsibidi abụghị mkpụrụokwu e ji ede ihe ọ bụ
5
ya butere o ji nwụọ n’oge maka n’ọbụ ihe ndị otu nzizo ji ekwu okwu. Ọ bụ ndị
otu nzizo dịka ndị Odo, mmanwụ, ekpe na Ọkọnkọ ji ya akparịta ụka (Ọraka,
1983).
Chomsky 1957 n’akwụkwọ Agbedo (2000) kọwara na ụtọasụsụ bụ usoro e
ji akpọpụta ahịrịokwu iji mara ma ahịrịokwu ahụ a kpọpụtara ma o so n’ụzọ
ụtọasụsụ nke na ndị na-asụ asụsụ a ga-ama, ma asụsụ ahụ ọ dị mma, ma o so
n’usoro. N’akụkụ nke ọzọ, Ọtagbụrụagụ, Obah, Onuigbo na Okorji (2007) kọwara
na ụtọasụsụ bụ mma ahịrịokwu na-eso n’usoro e si ekwu okwu iji gosi ka okwu
ahụ si adaba n’ahịrịokwu. Ụtọasụsụ bụ isi sekpu nti n’asụsụ ọbụla. Ọtụtụ ndị
mmadụ kọwara ụtọasụsụ dịka nghọta ha sị dị. Na nchịkọta ihe ndị mmadụ
kọwara, ụtọasụsụ bụ ịma usoro e ji ya ekwu okwu maọbụ usoro e ji ya ede ihe. Ya
bụ, usoro ụtọasụsụ kwesiri ịdị mfe n’ịghọta. Usoro okwu (sintaks) bụ nke na-eme
ka okwu soro n’usoro ma nwee nghọta.
Ime ka nwata akwụkwọ sekọndịrị mata Igbo ọ na-asụ maọbụ o ji ede ihe, o
kwesịrị ka nwata akwụkwọ ahụ mata nke ọma usoro ụtọasụsụ. Brooks na Oluikpe
kwuru na akwụkwọ Ubahakwe (2004) sị na ụtọasụsụ dịịri asụsụ otu akụkụ ahụ
mmadụ sị dịịrị mmadụ. Na nkọwa, onye ọbụla dị ndụ maọbụ onye nwụrụ anwụ
nwere akụkụ ahụ. Otu a ka ọ dị n’asụsụ na ụtọasụsụ. Ihe a na-egosi n’ịma asụsụ
Igbo maọbụ ide ya enweghị isi ma ọ bụrụ na nwata akwụkwọ amaghị ụtọasụsụ nke
ọma. Maka na mgbaso usoro ide asụsụ na-agbodo ụkwụ n’ụtọasụsụ bụ isi nsekpu
nti n’asụsụ ọ bụla. Balden 2003 kwuru sị na onye nkụzi ọbụla na-akuzi asụsụ Igbo
enweghị ike ịsụ maọbụ dee asụsụ Igbo nke ọma n’agbasoghị usoro ụtọasụsụ. Tupu
6
nwata akwụkwọ ọbụla asị na ọ mara Igbo asụ maọbụ ede okwesịrị ịmata
ụtọasụsụ nke ọma. Ọ bụrụ na ntụpọ adịghị n’odide Igbo, mara na Igbo a na-ede bụ
ihe efu. Ya kpatara Oruchalu (1989) ji wee kwuo sị na ntụpọ dị mkpa n’Igbo na o
nweghị ka a hapụ ya. A bịa n’ihe gbasara njụ, Igbo na Bekee na-adị iche. Ịma atụ:
(1) Hasn’t he eaten? Bekee azaa sị
No, he hasn’t.
Ma Igbo ga-aza sị
Ee, o ribeghị
E lee anya, a ga-ahụ na mgbe ụfọdụ, ebe Bekee na-asị , Igbo
na-asị . Nke a kpatara na nwata akwụkwọ Igbo kwesịrị ịgbaso usoro
ụtọasụsụ, mara ya nke ọma tupu ọ si na ya maara Igbo ede.
Ebe onye nchọcha gbadoro ụkwụ n’ụtọasụsụ bụ ọrụ ‘na’, ‘ga’, ‘ka’, ‘kwa’
na-arụ n’ahịrịokwu. Ihe a na-ebute mgbagoju anya n’ịmụ, na ide Igbo nke ọma
n’ebe ụmụ akwụkwọ kọleeji Igbo nọ. A bịa n’ọrụ ‘na’ na-arụ dịka njiko,
nnyemaka ngwaa, mbuụzọ, ọ na-enye ụmụ akwụkwọ nsogbu ịmata mgbe ‘na’ ga-
akwụrụ onwe ya maọbụ mgbe a ga-ewepụ ‘a’ dị na ‘na’. Mgbe ‘na’ na-ejiko okwu
abụọ maọbụ karịa, ‘na’ ga-akwụrụ onwe ya. Ima atụ;
2 (a) Ji na ede bụ ihe oriri.
(b) Ada, Nneka na Ngọzị bụ enyi.
Ma mgbe ‘na’ na-arụ ọrụ dịka mbuụzọ na-eso ụdaume, a ga-ewepu ‘a’ dị na ‘na’.
Ịma atụ
3(a) Nne nọ n’ụlọ
7
(b) Ha bi n’Aba
Ma mgbe ọ bụ na myiriụdaume ka ‘na’ na-eso ‘na’ ga-akwụrụ onwe ya dịka
njiko. Ịma atụ;
4(a) Azụ bi na mmiri.
(b) Anyị bi na Nsụka.
Mgbe ‘na’ na-arụ orụ dịka nnyemaka ngwaa, a na-eji akara uhie ede ‘na’, na
ngwaa ọ na-eso. Ịma atụ;
5(a) Anyị na-amụ akwụkwọ.
(b) Nne na-aga ahịa.
Ihe ndị a na-ebutere ụmụ akwụkwọ sekọndịrị skuul nsogbu mgbe a na-ewepu ‘a’
dị na ‘na’ na mgbe a na-ahapụ ya. Nsogbụ a na-eme ka ha ghara inweta akara nke
ọma n’ule akwụkwọ siiniọ skuul safiriketi Egzamineshọn (SSCE). Ọ dị mkpa
ịchọta onye maara n’Igbo nke ọma nke ga-enyere ụmụ akwụkwọ Igbo ịgbasa
usoro ụtọasụsụ n’ide Igbo ọkachasị n’ebe ụdaume dị.
Nsogbu Nchọcha
Ọtụtụ nsogbu dịịrị ụmụ akwụkwọ sekọndịrị skuul n’okpuru ọchịchị
mmụta Nsụka zoonu mere na ha anaghị emeta nke ọma n’ụtọasụsụ n’ule nzere
‘West African Senior School Certificate Examination’. Nsogbu ndị a bụ na e
bidoghị gboo kuzibere ha asụsụ Igbo bido n’akwụkwọ ọtaakara ruo na sekọndịrị.
Ụfọdụ ndị nne na nna e kweghị ka e jiri asụsụ Igbo kuzibere ụmụ ha ihe n’ụlọ
akwụkwọ. Ọzọ dịka ibe ya bụ na ha adịghị agbaziri ụmụ ha ka ha na-asụ Igbo
8
n’ụlọ. Ndị nkụzi na-akụzi asụsụ Igbo abụghi ndi a zụrụ n’asụsụ Igbo. Maka ihi nke
a, ha na-eji Bekee akụzi Igbo. Ụmụ akwụkwọ enweghị akwụkwọ ọgụgụ Igbo. Nke
na-eme na onye nkụzi na-akụzi, ha e bụrụ n’isi na-aza ya. Ihe a na-eme na ha
agaghị arụtali mkpụrụ okwu aka. Ọtụtụ oge ka a na-agbanwe akwụkwọ ọgụgụ
Igbo nke na-enye ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ Igbo nsogbụ n’ọmụmụ Igbo. Ndị
odee akwụkwọ Igbo na-enye ndị gọọmenti etiti aka azụ ka e were akwụkwọ ha
kuzibe ihe n’eleghị anya ma ọ ga-agbanwe atụmatụ nkụzi n’afọ. Oge ụfọdụ
akwụkwọ e dere adị iche na atụmatụ nkụzi. Nsogbo ọzọ bụ na ụmụ akwụkwọ
chere na onye na-amụ asụsụ Igbo maọbụ asụ asụsụ Igbo bụ onye amaghị
akwụkwọ. Maka ihi ya, ha enweghị mmasị n’asụsụ Igbo bụ epum ha.
Ihe ndị a bụ ihe na-ebutere ụmụ akwụkwọ ndị sekọndịrị nsogbu emeghị nke
ọma n’ụtọasụsụ asụsụ n’ule ‘West African Senior School Certificate
Examination’. Nkọwa ndị ‘Chief Examiners’ na ‘West African Examination
Council’ (2009) na-egosi na ụmụ akwụkwọ karịrị pesenti iri itoolu (90%) amaghị
akwụkwọ ọgụgụ onye nkụzi sịrị ha gụọ tupu ule akwụkwọ. Ha chọpụtara na ndị
nkụzi na-akụzi Igbo abụghị ndị a zụrụ azụ n’Igbo.
Ihe ndị a bụ ihe onye nchọcha chọpụtara na-eme ụmụ akwụkwọ sekọndịrị
emeghị nke ọma n’ụtọasụsụ n’ule ‘West African Senior School Certificate
Examination’.
Mbunuche Nchọcha
Mmeta nke ọma n’ụtọasụsụ n’ule sekọndịrị;
9
Ntule ule ụmụ akwụkwọ asụmabụọ na zoonu mmụta Nsụka dị na Steti Enugu.
Mbunuche nchọcha edemede a bụ ịchọpụta:
(a) Jenda ka eme nke ọma n’ule asụsụ Igbo.
(b) Akụkụ asụsụ Igbo na-enye ụmụ akwụkwọ nsogbu.
(ch) Akụkụ asụsụ Igbo ụmụ akwụkwọ ka eme nke ọma na ya.
(d) Ndịiche dị na nzata ndị bi n’ime obodo na obodo mepere emepe n’ihe
gbasara ụtọasụsụ.
(e) Ụmụ akwụkwọ na-asụ asụsụ epum ha ka ha si emedebe n’ụtọasụsụ.
Uru Nchọcha
Ihe ọmụmụ a nyere aka n’ịhazi kọrịkulum. Ọ bụ ndị kọrịkulum a lebere
anya ebe na-enye ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ nsogbu n’ọmụmụ ụtọasụsụ. Ọ bụ
ndị kọrịkulum a wetara usoro ndị nkụzi ji akụziri ụmụ akwụkwọ ụtọasụsụ nke
mere ka ụmụ akwụkwọ nwee mmasị n’ọmụmụ ụtọasụsụ. Ndị nkụzi na ụmụ
akwụkwọ ritere erere nke ukwu ma mgbe ha mere nke ọma n’ụtọasụsụ. Ọ bụ onye
nkụzi bụ onye nọ ọnụdụ ịmata ebe ụmụ akwụkwọ n’enwe nsogbụ n’ụtọasụsụ. Ọ
bụrụ na onye nkụzi amata ebe nsogbụ dị, o nyere ya aka ịma ụzọ o si a gbaziri
ụmụ akwụkwọ ka ha ghọta ụtọasụsụ nke ọma. Ọ na-enyere ụmụ akwụkwọ aka ịma
ka e si ede na ka e si agụ Igbo.
Ihe onye nkụzi na ụmụ akwụkwọ matara nyere ndị na-ede akwụkwọ Igbo
aka ịmata ebe ha gbadoro ụkwụ n’ide akwụkwọ Igbo ha. Ọ bụghịzị ka ihe a na-ede
n’akwụkwọ dị iche site n’ihe onye nkụzi na-akuziri ụmụ akwụkwọ. N’ikpeazụ, ọ
10
bụrụ na ụmụ akwụkwọ nwee mmasị n’ịgụ na ide Igbo nke ọma, o nye aka ibipụta
akwụkwọ ọgụgụ Igbo ọkachasị n’ebe ụtọasụsụ dị bụ ebe a na-enwekarị nsogbu
n’ihe gbasara ide Igbo.
Oke Nchọcha
Ọmụmụ a gbadoro ụkwụ n’obodo mepere emepe na ime obodo nke dị
n’okpuru ọchịchị mmụta zoonu Nsụka. E mere ka asụsụ Igbo soro n’asụsụ atọ na
Naịjirịa a ga-amụ n’ụlọ akwụkwọ. Ụmụ akwụkwọ na-ele Igbo n’ule Senior School
Certificate Examination (SSCE). N’agbanyeghị na ọtụtụ ụmụ akwụkwọ na-asụ
Bekee karịa asụsụ epum ha. Ebe ụlọ akwụkwọ sekọndịrị a dị, bụ ihe e lebere anya
maka na ha bikọtara ọnụ. Ụmụ akwụkwọ nọ na gburugburu ahụ ji otu akwụkwọ
amụ asụsụ Igbo.
Ọmụmụ a gbadoro ụkwụ ịma ka ụmụ akwụkwọ sekọndịrị skuul si gbadobe
mgbọrọgwụ n’ihe gbasara ụtọasụsụ. Ọ na-eme ka a matakwa ụtọasụsụ ụmụ
akwụkwọ na-enwe nsogbu karịa, nke ọzọ dịka ibe ya bụ ima jenda ka emee nke
ọma n’ụtọasụsụ na-arụtụkwa aka n’ebe ndị nọ n’ime obodo n’obodo mepere
emepe si eme n’ụtọasụsụ.
Ajụjụ Nchọcha
Ajụjụ nchọcha ndị a nyere maka ọmụmụ a;
(a) Kedu ka ụmụ akwụkwọ na-asụ asụsụ epum ha si emedebe nke ọma
n’ụtọasụsụ?
(b) Kedu ka jenda si emetuta mmeta nke ọma n’ule asụsụ Igbo?
11
(ch) Kedu akụkụ ụtọasụsụ ụmụ akwụkwọ ka-enwe nsogbu?
(d) Kedu ndịmiche dị na nzata ndị bi n’ime obodo na obodo mepere emepe
n’ihe gbasara ụtọasụsụ?
(e) Kedu akụkụ ụtọasụsụ ụmụ akwụkwọ ka-eme nke ọma?
12
ISI NKE ABỤỌ
NTỤLEGHARỊ AGỤMAGỤ
Ntulegharị a gbadoro ụkwụ n’isiokwu na nkebi isiokwu.
Nkọwa ọkpụrụkpụ okwu.
Ọnọdụ asụsụ Igbo na Naịjirịa
Asụsụ
Mmamasụsụ
Ụtọasụsụ
Atụtụ Nchọcha
Atụtụ ọkwa Mmụta
Atụtụ okwu Ụbụrụ
Ntụlegharị Ederede
Nsogbu dịrị ụmụ akwụkwọ Igbo n’ọmụmụ asụsụ Igbo
Ndị ka eme nke ọma na ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị n’asụsụ Igbo.
Ndị ka eme nke ọma n’ụmụ akwụkwọ bi n’ime obodo na obodo
mepere emepe.
Nchịkọta Ntụlegharị
Ọnọdụ Asụsụ Igbo Na Naịjirịa
Asụsụ Igbo bụ otu n’ime asụsụ atọ e wepụtara dịka asụsụ ala Naịjirịa a ga
na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ ọtaakara, sekọndịrị, koleeji edukeshọn na mahadum. Ndị
Igbo gbasara ụwa niile ebe ha na-achụ ọrụ Bekee. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ahịa ma
13
a bịa n’ebe ndị Igbo a gbasara n’ụwa niile, ha na-emekọrịta ka ụmụnne ma ha hụ
onwe ha maọbụ nụ onye sụrụ asụsụ Igbo. Ward 1941 bụ onye nchọcha gbasara ihe
ọmụmụ asụsụ Igbo Lingwuistiiki chọpụtara na ndị Igbo bụ ndị na-arụsị ọrụ ike
n’ịkọ ugbo, ịzụ ahịa ma gbasakwa na mpaghara Naịjirịa maka ịchọ ọrụ Bekee.
Dịka Uchendu (1965) na Ilogu (1974) kwuru n’akwụkwọ Nwadike (2002) sị na
ndị Igbo abụghị ndị nwere otu omenala ebe ha siri bịa. Ma e nwezuga ihe gbasara
ịkpụ ụzụ na o nweghị onye ga-akọwanwu ebe ha siri bịa maọbụ ebe ha gbara
mgbọrọgwụ.
Onye kọwara ebe ndị Igbo sịrị bịa bụ Ọlaudah Equino maọbụ Gustavus
Vassa the African n’akwụkwọ Nwadike (2002) ihu akwụkwọ nke atọ bụ onye
Igbo e rere ere ka ohu mgbe ọ dị afọ iri na abụọ. Ọ sị na ndị Igbo bụ agbụrụ ndị
Izrel furu efu. Ihe o ji kwado okwu ya bụ na ndị Igbo na-ebi ugwu ka ndị Juu, na-
asọ ụmụ nwaanyị mụrụ nwa ọhụụ nsọ otu ọnwa nakwa mmekọ nwaanyị nọ na nsọ.
Ha na-agụ nwa aha n’abalị asatọ dịka ndị Juu si eme. Ihe ndị a bụ ihe o kpebiri sị
na ndị Igbo bụ ndị Juu furu efu. E wezuga na a sị na ndị Igbo bụ ndị Juu furu efu,
narị puku mmadụ gbara ndị Igbo ụfọdụ ajụjụ ọnụ wee chọpụta na ndị Igbo si
Ibibio, Ogoja na Ekọị bụ mparagha ọdịda anyanwụ Naịjirịa, ebe ndị Ịjọ bụ ndị
mgbago-ugwu ọdịda anyanwụ, ndị Igara bụ ndi mgbago ugwu Naịjirịa. Mgbasa
aka ebe ndị Igbo siri bịa mere ndị Igbo ekweghị nwee otu nna (Nwadike, 2002).
14
Asụsụ
Asụsụ Igbo bụ ihe e ji ama onye bụ onye Igbo kpọmkwem. Asụsụ Igbo bụ
ihe na-ejiko mmekọrịta mmadụ na ibe ya, ịkụziri ụmụaka ihe bụ omenala maọbụ
igwu egwu ọnwa. Asụsụ Igbo dị mkpa n’ihi na e wezuga asụsụ o nweghị onye ga-
asị na onye a bụ onye a maọbụ agbụrụ onye siri bịa. Ka nkọwaokwu “New
Encyclopaedia Britannica” 1992 siri kwuo, asụsụ bụ ekwumokwu, idetu mkpụrụ
okwu nke jikọtara ndị mmadụ ọnụ na mmekọrịta otu omenala. Nke a bụ eziokwu
maka na e wezụga asụsụ, e nweghịzị mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Kirkpatrick
2003 sịrị na asụsụ bụ nkọwapụta ebunuche mmadụ na ka mmadụ si wee chee
echiche n’ụzọ mmegharị ahụ maọbụ idetu ihe n’usoro amamihe nke mmekọrịta
mmadụ na ibe ya. Williams 2001 kọwara sị na asụsụ bụ otu n’ime omenala nke e
si n’ime ya akọwa ihe omenala bụ. Asụsụ bụ isi sekpu nti mmadụ na ibe ya ji
emekọrịta, ekwukọrịta, ama ihe na-aga maọbụ echiche dị mmadụ n’obi. Asụsụ bụ
ihe kewere mmadụ na ihe ndi ọzọ Chukwu kere. Mgbodile (1999) kwuru sị na
sọọsọ mmadụ bụ ihe okike Chukwu kere nwere ike ịmụ asụsụ maọbụ jiri ya kwuo
okwu. Brooks 2006 kọwara na asụsụ bụ ihe a na-amụ n’usoro mkpụrụ edide nke
jikọtara ndị mmadụ n’usoro omenala. Ọ bụghị ebe ọ bụla n’ụwa ka asụsụ na-abụ
otu ihe na mkpọpụta maọbụ n’o dide. Ịma atụ.
6(a) Nwoke n’Igbo bụ ‘nwoke’.
(b) Nwoke na Yoruba bụ ‘okunri’.
(ch) Nwoke n’Awụsa bụ ‘miji’.
(d) Nwoke na Bekee bụ ‘man’.
15
Ya bụ nwoke enweghị otu mkpọpụta maọbụ ederede n’asụsụ ụwa niile.
Mmamasụsụ
Mmamasụsụ dị otu chi si kee ya. Onye na-amụ asụsụ ga-asị na ya maara
asụ nke ọma mgbe onye ahụ ga-akpọpụtalị asụsụ nke ọma, jiri ya dee ihe n’usoro
ụtọasụsụ. Mgbe ụmụ akwụkwọ na-asụ asụsụ nke ọma, jiri ya bụ asụsụ dee ihe nke
ọma, mgbe ahụ ka a ga-asi na mmamasụsụ ụmụ akwụkwọ sekọndịrị skuul mara
mma. Ma mgbe ha emeghị nke ọma n’ule e nyere ha n’asụsụ Igbo, nke a na-egosi
na mmamasụsụ ha adabaghị. Mgbe ahụ ka onye nkụzi ga-ama ụzọ ọ ga-esi kuziere
ha ka nzumoke ha dị mma. Ọmụmụ asụsụ gbadoro ụkwụ na mmamasụsụ a ga-eji
nwalee ụmụ akwụkwọ dịka otu ha si asụ asụsụ Igbo, ka ha si-agụ ederede Igbo, ka
ha si-ede Igbo, ka ha si e ji asụsụ Igbo akparịta ụka, ka ha si-aza ajụjụ n’Igbo na ka
ha si ajụ ajụjụ ọnụ n’Igbo. Ọ bụrụ na ụmụ akwụkwọ amaghị ka e si-eme ihe ndị a
e deputara, a mara na mmamasụsụ ha enweghị isi. Ọ bụrụ na nwata akwụkwọ na-
ede Igbo dee Bekee tinye, a mara na mmamasụsụ ya ezughị oke.
Nzumoke asụsụ dịka Chomsky si kwuo n’akwụkwọ Agbedo (2000) bụ
mkpọkọba ọnụ amamihe n’ebe asụsụ onye dị nke na onye ahụ na-asụ ya agaghị
enwe nkụja ọbụla maka na ọ bụ asụsụ epum ya. Ebe mmamasụsụ Igbo bụ nwata
akwụkwọ iji Igbo kpaa nkata nke ọma. Chomsky wee na ekwu na nzumoke asụsụ
bụ etu onye si nwee amamihe n’asụsụ ọ na-asụ dịka onye nwee asụsụ ahụ si asụ.
Nzumoke asụsụ bụ ịsụ asụsụ nke ọma, ọ bụghị ịmụ asụsụ. Mgbe a ga-asị na
mmamasụsụ nwata akwụkwọ amaka bụ mgbe a nwalere ya n’asụsụ, o mee nke
16
ọma. Onye nkụzi ga-eleba anya na ndabere na agbata nwata akwụkwọ ka o wee
mata ebe nwata ahụ na-enwe nsogbu maọbụ ebe o nwere mmasị n’ịmụ asụsụ Igbo
maka na ọtụtụ ụmụ akwụkwọ si ime obodo ebe a na-asụ olundị karịa. Ọ bụrụ na
onye nkụzi elebeghị ha anya nke ọma a mara na ọmụmụ asụsụ Igbo ha ga-enye
nsogbu niihi na ọtụtụ n’ime ha na-asụ olundị ha. Igbo izugbe na-ara ha ahụ ịsụ ma
ya fọdụzịa ide ya ede. Ọ bụrụ na onye nkụzi elebaghị anya n’ebe ndabere ha, a
mara na ịmụ asụsụ Igbo ga-ara ha ahụ ọkachasị n’ebe ụtọasụsụ dị. Mmamasụsụ
Igbo ga-abụ ihe enweghị isi.
Onye nkụzi ga-ama na e nwere ndịiche dị n’ụmụ akwụkwọ na o nweghị
ụmụ akwụkwọ abụọ nwere otu omume, amamihe maọbụ nghọta. Ụfọdụ ụmụ
akwụkwọ ka ama asụ asụsụ karịa ndị ọzọ ọkachasị ụmụ akwụkwọ si n’obodo
mepere emepe. Ọ bụrụ na onye nkụzi elebeghị anya n’ihe dị etu a mara na
mmamasụsụ lara n’iyi. Ụmọ (2001) kọwara na mmamasụsụ ụmụ akwụkwọ na-
adachigha azụ n’asụsụ Igbo. Iji kwado ihe Ụmọ kwuru, ụmụ akwụkwọ enweghịzị
mmasị n’asụsụ ala nna ha n’ihi na ha na-asị na o nweghị ebe asụsụ Igbo na-eduga
mmadụ. Nne na nna ụfọdụ anaghị ekwe ụmụ ha isụ asụsụ Igbo maka na onye
obụla chọrọ ịbụ Bekee. Akwụkwọ ọgụgụ Igbo ga-abụ otu atụmatụ nkụzi n’obodo
mepere emepe na ime obodo. Ndị na-ede akwụkwọ Igbo ga-eji Igbo izugbe dee
akwụkwọ ọgụgụ. Ọ bụrụ na ode akwụkwọ Igbo jiri Igbo izugbe dee akwụkwọ ya
onye nkụzi ga-akụzi ụmụ akwụkwọ nke ọma. Mgbe mmamasụsụ na nzumoke ha
pụtara ihe nke ọma n’ule asụmabụọ sekọndịrị skuul, a mara n’ihe na-aga nke ọma.
Akwụkwọ e dere n’olundị ekweghị onye nkụzi akụzi ihe nke ọma ma ụmụ
17
akwụkwọ agaghị agụta akwụkwọ ọgụgụ Igbo nke ọma. A bịa n’ụdị ihe ndị a,
mmamasụsụ na nzumoke ụmụ akwụkwọ ga-abụ ihe efu. E kwesịrị ka e lebee anya
onye nkụzi ga-akụzi asụsụ Igbo tupu a sị ya kuzie ya. Mana onye nkụzi ahụ
enweghị mmasị n’asụsụ Igbo agaghị akụzi ya nke ọma ma ụmụ akwụkwọ agaghị
enwe mmasị n’ịmụ asụsụ Igbo. Ya ka Ụmọ (2001) kwuru sị, ihe na-eme na
mmamasụsụ ụmụ akwụkwọ adịghị nke ọma n’ule asụmabụọ siiniọ skuul bụ na e
nweghị ezigbo onye nkụzi Igbo. Ekechukwu (1990) kwuru sị na ihe na-ebute ụmụ
akwụkwọ sekọndịrị skuul amaghị asụ Igbo bụ na e ziteere ha ndị nkụzi a zụghị
nke ọma n’Igbo. Ọ rụtụrụ aka na ndị nkụzi e nwere n’Igbo bụ ndị nwere nzere
mmụta nke Bekee kpọrọ (Grade II) ndị ọzọ nwere nzere ha na ‘Nizenan Certificate
Education’, ebe ndị ọzọ nwere nzere ha na Mahadum n’asụsụ ọzọ abụghị Igbo.
Ndị a bụ ndị a kwanyere ka ha kụzie asụsụ Igbo na sekọndịrị. Anyawụ (1986)
kwuru sị na ndị nkụzi enweghị mkpalite mọọ na nkụzi asụsụ Igbo mere na ụmụ
akwụkwọ enweghị mmasị n’ọmụmụ asụsụ Igbo. Mgbe ihe ndị a ha rụtụrụ aka na-
eme a mara na mmamasụsụ ndị sekọdịrị n’ule juniọ na siiniọ skuul agaghị adị
mma.
Ụtọasụsụ
Ndị ode akwụkwọ kọwara ụtoasụsụ n’ụzọ dị iche iche. Nkọwa okwu
kọwara ụtọasụsụ dịka ụzọ asụsụ si akọwa mmebe ahịrịokwu. Asụsụ ọ bụla nwere
usoro ụtọasụsụ. Ụtọasụsụ bụkwazị ihe e ji akọwa asụsụ. Iwu ụtọasụsụ bụ ọdịdị
mkpụrụ asụsụ na ọdịdị usoro okwu nwere nchịkwaba mmewere n’asụsụ ọ bụla.
18
Asụsụ Igbo nwere usoro iwu dị mfe na mkpụrụ asụsụ na usoro okwu ma a bịa
n’asụsụ Bekee enwe mgbagoju anya. Ima atụ:
Nkọwa ya na Bekee Ụdịdị ya n’Igbo
7(a) Emeka goes to the market Emeka na-aga ahịa
(b) Emeka is going to the market Emeka na-aga ahịa
(ch) I went to the market Agara m ahịa
(d) I am coming Ana m abịa
I lee anya n’ahịrịokwu ndị a, ị hụ na ngwaa Igbo bụ otu na ahịrịokwu ndịmecha,
ndịnihu na ndịugbua. Ma a bịa na Bekee, ọ dịghị otu ahụ. Ihe na-enye ụmụ
akwụkwọ sekọndịrị skuul nsogbu n’ụtọasụsụ bụ ọtụtụ olundị e nwere na Nsụka.
Mkpọpụta okwu ụfọdụ ụmụ akwụkwọ na ka ha si ede ya abụghị otu. Otu ụfọdụ si
akpọpụta ụda ‘L’ na ‘N’. Ịma atụ.
8(a) niile liine
(b) ogologo ogonogo
(ch) ala m ana m
(d) larue narue
Ebe onye nchọcha gbadoro ụkwụ bụ n’ụtọasụsụ. Ya bụ ọrụ ‘na’, ‘ga’, ‘ka’,
‘kwa’ na-arụ. Ọgbalụ (1974) Okonkwọ (1977) na Emenanjọ (1978) kọwara na
‘na’ na-ọrụ ọrụ dịka njikọ, nnyemaka ngwaa na mbuụzọ. Mgbe ‘na’ na-arụ ọrụ
dịka mbuụzọ na-eso ụdaume, a na-ewepu ‘a’, dị na ‘na’ tinye rịkọm elu na ‘na’.
Ịma atụ:
9 (a) onye nkuzi nọ n’ụlọ akwụkwọ.
19
(b) Ada nne m bi n’Akụ.
Mgbe ‘na’ na-arụ ọrụ dịka mbuụzọ, na-eso mgbochiume ‘na’ ga-akwụrụ onwe ya.
Ịma atụ
10 (a) Ji ahụ dị na nkata.
(b) Mmanya ọcha dị na karama.
Ihe ndị a na-ebute mgbagoju anya n’ebe ụmụ akwụkwọ sekọndịrị skuul nọ nke
mere na ha amaghị mgbe ‘na’ na-akwụrụ onwe ya maọbụ mgbe a na-ewepu ‘a’, dị
na ‘na’ tinye ya rikọm elu (’). Ihe a na-ebutere ha ọdịdị n’ule asụmabụọ siiniọ
skuul.
N’ịga niihu, ‘na’ na-arụ ọrụ dịka nnyemaka ngwaa, na-arụkwa ọrụ dịka
njiko okwu. Mgbe ‘na’, na-arụ ọrụ dịka nnyemaka ngwaa, ọ na-enyere ngwaa ọ
na-eso aka ka ahiriokwu nwee nghọta. Mgbe ahụ, a na-eji akara uhie (-) jikọ ‘na’
na ngwaa ọ na-enyere aka. Ima atụ
11(a) Ọ na-ekwu okwu ọsọ ọsọ.
(b) Aka ya na-esi azụ azụ.
Mgbe ‘na’ na-arụ ọrụ dịka njiko, ‘na’ na-akwụrụ onwe ya. ‘Na’ na-ejiko okwu
abụọ maọbụ karia ọnụ. Ịma atụ:
12(a) Okorie na nwunye ya nọ ebe a.
(b) Ha matara na Omenụkọ nwere uche nke ukwu.
‘Na’, na-ejiko nkebiokwu na nkejiahịrị ọnụ ha wee bụrụ ahịrịokwu. Ịma atụ
13(a) Ịtụ asi na izu ori adịghị mma.
(b) Olee onye sị na anyị abụghị mmadụ?
20
Mgbe ‘na’ na-arụ ọrụ dịka njụ a na-agbakwunyere’ghi’ na-azụ ‘na’. Ịma atụ
14(a) Ọ naghị ahụ ụzọ.
(b) Ha naghị aga njem ahụ ọzọ?
Ihe a bụ nsogbụ dịrị ụmụ akwụkwọ Igbo ndị sekọndịrị skuul maka na ha amaghị
mgbe ‘na’ ga-akwụrụ onwe ya maọbụ mgbe e ji akara uhie (-) ejiko ‘na’ na ngwaa.
Ha kọwakwara na ọ bụghị sọọsọ ‘na’ na-arụ ọrụ n’ụtọasụsụ Igbo ‘Ga’, ‘ka’,
‘kwa’, na-arụ ọrụ n’ụtọasụsụ Igbo. Mana e jighị ha kpọrọ ihe maka na ha adịghị
mkpa n’ụtọasụsụ dịka ‘na’ si wee dị mkpa n’ụtọasụsụ n’ule asụmabụọ siiniọ
skuulu. Mana onye nchọcha sị ka ọ rụtụ ha aka dịka otu n’ime ụtọasụsụ. Mgbe
‘ga’ na-arụ orụ dịka nnyemaka ngwaa ‘ga’ ga-akwụrụ onwe ya, e jiri akara uhie (-)
jiko ‘ga’ na ngwaa ka o gosi na ha na-arụ otu ọrụ. Ịma atụ
15(a) Di m ga-aga ọrụ.
(b) Chidalụ ga-eri nri.
‘Ga’ na-arụkwa ọrụ ọzọ dịka nnyemaka ngwaa, mgbe ahụ ‘ga’ ga-akwụrụ onwe
ya, a gaghị e ji akarauhie jiko ‘ga’ na ngwaa. Ima atụ:
16(a) Aga m abịa echi.
(b) Aga m enwe ego.
(ch) Ha agaghị eti ya ihe ma ọ bata
Ọfọmata (2003) kọwara na ‘ka’ na-arụ ọrụ nsonaazụ n’ahịrịokwu ndị a. Ịma atụ:
17(a) Nwaanyị ahụ ebuka ibu.
(b) Chiọma amaka mma.
21
E lee anya n’ahịrịokwu ndị a, a hụ na ọrụ ‘ka’ na-arụ bụ ọkọwa ntunyere na ọ
bụghị nsonaazụ. Okonkwọ (1977) kọwara na ‘kwa’ na-arụ ọrụ dịka nsonaazụ. Ima
atụ:
18(a) O nwere ọtụtụ ewu nwekwa ọtụtụ ọkụkọ.
(b) Rie nri nụọkwa mmanya.
Atụtụ Nchọcha
E nwere ọtụtụ kọwara maka mmata na ọmụmụ. Atụtụ dị iche iche n’
ọnụọgụ pụtara ihe maka mmata asụsụ. Ụfọdụ n’ime ha ka e lebere anya. Ebe
ọgbara ọhụrụ bidoro pụtawa, a hapụzịa nke ochie gbasowe ọgbara ọhụụ.
Atụtụ Ọkwa Mmụta
Ọkwa atụtụ mmụta hụrụ nwata ka ihe enweghị ihe dị ya n’isi nke na ọ bụ
okenye bụ ihe ga na-akụziri ya ihe o kwesiri ịma maọbụ ime. Brown 1991 kọwara
nwata n’usoro ndị ọkwa atụtụ mmụta dịka ntọgbo chakoo ya bụ na echiche ya
togboro chakoo. Ọ bụ ebe nwata na-eto ga-enye aka kụziere ya asụsụ site
n’ikwado ya maọbụ inyere ya aka. Atụtụ ọkwa mmụta kwenyere na mgbe a mụrụ
nwata na o nweghị ihe dị ya n’isi gbasara ụwa maọbụ asụsụ. Ya bụ na ihe nwata
ga-asị na ya mara bụ ihe ọ mụtara na gburugburu ya. Gburugburu a mụrụ nwata
nwere nnukwu ọrụ nke ukwu n’ihi na ọ bụ ebe ahụ ka nwata sị amụta asụsụ maọbụ
omume ndị ọzọ dị iche iche.
Atụtụ ọkwa mmụta kwenyere na omume nwata bụ ihe a na-ahụ anya, ihe ha
ji gbado ụkwụ na nkọwa a bụ ihe mmadụ na-eme bụ ihe e ji ama onye ahụ.
22
Skinner 1957 otu n’ime ndị na-akwado atụtụ ọkwa a, sịrị na okwu na-egosi
omume mmadụ nke e nwere ike ịgbaziri n’ụzọ dị mma. Na mgbe a na-agbaziri
mmadụ, onye ahụ na-eme ihe na-aga n’ihu, ma mgbe o nweghị onye na-agbaziri
ya n’ihe dị mma, omume ya ga-anyụ ka ọkụ. Bloofield 1933 kọwara n’akụkụ nke
ya sị na atụtụ sayensị kwesịrị bụ nke a na-ahụ anya wee mara ka e si asụ ya. Nke
emeghị otu ahụ abụghị asụsụ. Ha kwenyere na tupu nwata amụta ka e si asụ asụsụ
na ọ ga-enwe ihe mgbado ụkwụ dịka akparamagwa, ikwu ihe a jụrụ ya, iche
echiche n’ihe ọ na-amụ, ịmụnwo ihe ọ na-amụ na ibu ihe ọ mụrụ n’isi.
Nwata akwụkwọ na-amụ asụsụ Igbo ga-ebido n’isi mụọ asụsụ Igbo
ọkachasị n’ebe ụtọasụsụ dị. Nke a ga-abụ site na nkwado nke onye nkụzi,
ikwunwuo ihe onye nkụzi kwuru, iche echiche ọma n’ihe a kụziri, ikwugharị ihe a
kụziri, ịkụrụ ya aka mgbe ọ zatara ajụjụ. Mgbodile (1999) kọwara ka nwata si
amata ihe bido n’ọnwa isii ruo otu afọ. Nwata na-amụ asụsụ mgbe naanị ya nọ.
Nwata ahụ ji ụdaume na mgbochiume emebe okwu. Ima atụ, ‘Pa pa’, ‘ma ma’, ‘ta
ta’. Mgbe ọ dị afọ abụọ, ọ mụta ikwu otu okwu ugboro ugboro. Ịma atụ, mama nri,
mama mmiri, papa tii. Afọ nke atọ ruo na ise, o bido ịzọ ihe azọ dịka mkpụsị odee,
osisi, iko, ige ntị n’ihe mmadụ na-ekwu, ịgụ eserese, inwe agụụ mmekọrịta
mmadụ. N’afọ isii ruo na asatọ, nwata amụta ikwupụta echiche ya, ide ihe, ịjụ
ajụjụ. Ọ bụ nne ya maọbụ ụmụnne ya ga-agbaziri ya mgbe ọ na-aga n’afọ ndị a
nke a ga-agba nwata akwụkwọ na-amụ asụsụ Igbo ume ọkachasị n’ebe ụtọasụsụ dị
maka na nne ya bidoro gboo kuzibere ya asụsụ mgbe ọ dị na nwata.
23
Atụtụ Ọkwa Ụbụrụ
Ndị ọka mmụta ọzọ kọwara maka mmụta asụsụ dị iche iche na ndị otu atụtụ
ọkwa mmụta. Onye ndu ha bụ Noam Chomsky 1957 onye ọzọ nyere ya aka bụ
Lenneberg 1969. Ndị otu a bụ ihe tinyere ọnụ etu kwesiri ka e si mụọ asụsụ. Ihe e
ji mara ndị otu a bụ atụtụ ọkwa ụbụrụ, mbudo nsi n’ụbụrụ. Ha na-akọwa na nwata
ọbụla pụtara uwa nwere ihe Chukwu ji kee ya nke ga-enyere ya aka ịma maọbụ
ịmụta asụsụ maka na ụbụrụ nwata dị nkwadebe ịmụ asụsụ ọbụla nọ na gburugburu
ya. Ihe a bụ ihe na-enyere ha aka ka ha mụta asụsụ n’esoghị usoro. E soro n’usoro
ka ndị atụtụ ụbụrụ si kwuo na nwata akwụkwọ Igbo kwesịrị ịmụta asụsụ Igbo nke
ọma maka na ọ bụ asụsụ epum ya. Maka na o nwela echiche Chukwu tinyere ya
n’ime, nke a na-eme na o nwere ike ịmata asụsụ ọbụla ma o tinye echiche nke ọma
ọkachasị n’ihe gbasara ụtọasụsụ.
Ntụlegharị Ederede
Nsogbu Dịrị Ụmụ Akwụkwọ Igbo N’ọmụmụ Asụsụ Igbo
Ọtụtụ akwụkwọ lebere anya n’ihe na-ebute ndagbachi azụ ụmụ akwụkwọ
n’ihe gbasara ọmụmụ asụsụ epum ha. Maka nke a ka Ayara na Enwe (1996) lebere
anya nsogbu na-adakwasị nkụzi asụsụ Igbo n’ụlọ akwụkwọ bido na ndị ọtaakara
ruo na kọleeji dị na Zoonu Mmụta nke Nsụka. Ndị nkụzi nari abụọ ka ha họpụtara
n’ime ụlọ akwụkwọ dị iri atọ. Ajụjụ ederede ka e ji mee nchọpụta tinyekwere ilebe
anya n’akwụkwọ ụmụ akwụkwọ dere n’Igbo. Ihe ha chọpụtara na-egosi na e
nwere nsogbu gbasara nkụzi asụsụ Igbo n’akụkụ ahụ. Nsogbu ahụ bụga ndị isi ụlọ
24
akwụkwọ anaghị akwado nkụzi asụsụ Igbo, oge e nyere nkụzi asụsụ Igbo pere
mpe, mgbawo akwụkwọ ọgụgụ Igbo oge ọbụla na-enye nsogbu, e nweghị ndị
nkụzi a zụrụ n’Igbo na-akụzi asụsụ Igbo nke ọma.
Onye nchọcha chọpụtara na nsogbu dịrị ndị ugbu a n’ọmụmụ asụsụ Igbo bụ
na nne na nna ụfọdụ ekweghị ka e jiri asụsụ Igbo kuzibere ụmụ ha ihe bido
n’akwụkwọ ọtaakara ruo na sekọndịrị, olundị karịrị na Nsụka ekweghị ka ụmụ
akwụkwọ mata ịsụ Igbo izugbe nke ga-enyere ha aka n’ọgụgụ akwụkwọ odide
n’Igbo, ndị nkụzi na-akụzi Igbo anaghị aga nchọcha maọbụ ọgbakọ ịmata
mgbanwo ụfọdụ dị n’Igbo, o nweghị akwụkwọ ụtọasụsụ e dere n’Igbo nke na-
enyere ndị nkụzi ikuzi ụtọasụsụ nke ọma. N’ikpeazụ, egwuregwu Igbo a na-eme
n’onyonyo, Bekee ka e ji ekwu okwu. Ihe ndị a bụ nsogbu dịrị ụmụ akwụkwọ Igbo
n’ọmụmụ asụsụ Igbo tụmadị ụtọasụsụ.
Anọlue na Chima (1998) nyochara etu a ga-esi akụzi na-amụkwa asụsụ
Igbo nke ọma na kọleeji dị n’okpuru ọchịchị Nnewi dị na Steeti Anambara. Ndị
nkụzi iri anọ na ụmụ akwụkwọ narị abụọ ka ha họpụtara n’ụlọ akwụkwọ dị iri
n’ọnụọgụ. Ajụjụ ederede ka e ji kpokọba ihe nchọpụta tinyekwara usoro ndị nkụzi
si agbasa nkụzi asụsụ Igbo na klaasị. Rịzọọlt na-egosi nsogbu dị na nkụzi asụsụ
Igbo na mpahara ahụ. Nsogbu ahụ bụ na ndị nkụzi a zụrụ azụ n’Igbo pere mpe
karịa ndị a zụghị n’Igbo, ndị a zụghị n’Igbo anaghị eso usoro nkụzi asụsụ Igbo
dịka ndị a zụrụ azụ si eso, ụmụ akwụkwọ anaghị agụta asụsụ ederede Igbo nke
ọma, ụmụ akwụkwọ ọnụọgụ ha pere mpe ka a na-anabata ka ha gụọ Igbo na
Mahadum. Ndịmiche ya na nchọcha a bụ na ndi Igbo e jighị asụsụ ha kpọrọ ihe, ọ
25
na-eme ụfọdụ ndị Igbo ihere isi na ha bụ ndị Igbo ma ya fọdụzị ịnụ asụsụ Igbo
n’ọnụ ha, ebidoghị n’oge kuzibe asụsụ Igbo n’ụlọ akwụkwọ ọtaakara ka ụmụ
akwụkwọ nwee mmasị n’asụsụ Igbo, ma okenye ma nwata, ndị ọbụla chọrọ ịbụ
ndị Bekee mere na o nweghị onye Igbo nwere ike ịsụ Igbo nke ọma n’asughị
Bekee.
Iji kwado ihe ndi ọzọ kwuru, Ewelum na Eze (2003) lebere anya na nsogbu
dịịrị ụmụ akwụkwọ koleeji nọ n’okpuru ọchịchị Nsụka n’ihe gbasara ide edemede
Igbo. Ụmụ akwụkwọ narị abụọ na ndị nkụzi iri abụọ na-akụzi Igbo ka a họpụtara
n’ime ụlọ akwụkwọ dị na Nsụka. Ajụjụ ederede ka e ji chọpụta nsogbu ụmụ
akwụkwọ tinyekwara ederede ụmụ akwụkwọ. Nsogbu onye nchọcha chọpụtara bụ
na ụmụ akwụkwọ amaghị abịịchịị Igbo nke ha na-ama ederede Igbo, ha anaghị
etinye kpọm ebe o kwesịrị n’Igbo, ha anaghị etinye akara ụdaolu ebe o kwesịrị,
ụfọdụ ndị nkụzi Igbo amaghị akụzi ederede Igbo, ndị amụghị maka asụsụ Igbo na-
akụzi Igbo. Site na rịzọọlt ka onye nchọcha na-akwado ka ndị na-akụzi asụsụ Igbo
na sekọndịrị bụrụ ndị maara n’Igbo, onye nkụzi Igbo; ọbụla kwesịrị ijiri ngwaa
nkụzi akụzi Igbo ọkachasị n’ide ederede Igbo; ndị isi ụlọ akwụkwọ ịmapụta
amụma maka ọgbakọ, nchọcha, na njem nlere anya maka ndị nkụzi na ụmụ
akwụkwọ Igbo; ndị na-akwado mwulite asụsụ na omenala Igbo ga-ama ọrụ dịịrị ha
site n’inye ụlọ akwụkwọ ego na iziga ndị maara Igbo nke ọma n’ụlọ akwụkwọ dị
iche iche nke ga-eme ka nkụzi na ọmụmụ Igbo na-atọ ụtọ; ndị isi ụlọ akwụkwọ ga-
ahụ ndị nkụzi Igbo ji usoro dị mma na-akụzi asụsụ Igbo n’ụlọ akwụkwọ ọkachasị
n’ebe ederede Igbo dị.
26
Ntụlegharị edemede nchọcha a, Ayara, Eze na Enwe (1996) lebere anya na
nsogbu dịịrị ụmụ akwụkwọ Igbo n’ọmụmụ asụsụ Igbo. Nsogbu ahụ bụ na ndị isi
ụlọ akwụkwọ anaghị akwado nkụzi asụsụ Igbo; oge e nyere nkụzi asụsụ Igbo pere
mpe; mgbanwo akwụkwọ ọgụgụ Igbo oge ọbụla na-enye nsogbụ; o nweghị ndị
nkụzi a zụrụ n’Igbo na-akụzi asụsụ Igbo nke ọma. Ihe ndị a bụ ihe onye nchọcha
chọpụtara bụ nsogbu dịịrị nye ọmụmụ asụsụ Igbo bido n’akwụkwọ ọtaakara ruo na
sekọndịrị.
Anọlue na Chima, lebere anya etu a ga-esi akụzi na-amụkwa asụsụ Igbo
nke ọma na koleeji. Onye nchọcha chọpụtara na nsogbu bụ na ndị nkụzi a zụrụ azụ
n’Igbo pere mpe karịa ndị azụghị n’Igbo, ndị azụghị n’Igbo anaghị eso usoro
nkụzi asụsụ Igbo dịka ndị a zụrụ si eso, ụmụ akwụkwọ ọnụọgụ ha pere mpe ka a
na-anabata ka ha gụọ Igbo na Mahadum.
E lee anya na ntụlegharị edemede a hụ na ọ na-akọwa etu ihe nsogbu dịịrị
ụmụ akwụkwọ na ndị nkụzi Igbo n’ọmụmụ na ederede asụsụ Igbo. Ya bụ
mmamasụsụ Igbo niile ka e lebere anya na elebeghị anya n’ụtọasụsụ bụ ihe izizi
nwata akwụkwọ ga-ama tupu ọ mara ka e si agụ na ka e si ede edemede Igbo. Ya
ka onye nchọcha ji nwee mmasị ilebe anya n’ụtọasụsụ Igbo bụ ihe izizi nwata
akwụkwọ ọbụla ga-ama.
Ndị Ka Eme Nke Ọma N’Ụmụ Nwoke Na Ụmụ Nwaanyị N’asụsụ Igbo
Ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị dị mkpa n’asụsụ tụmadị n’asụsụ Igbo. Ya mere na
Omeje (1998) lebere anya n’uru ọ bara ụmụ akwụkwọ nọ n’okpuru ọchịchị mmụta
27
Nsụka iji usoro arụmarụ ede edemede n’Igbo. Ụlọ akwụkwọ abụọ n’obodo mepere
emepe ka ọ họpụtara (otu nwoke na otu nwaanyị) bụ ndị e ji wee mee ya. Ihe e ji
mee nchọpụta bụ ndị sịịniọ sekọndịrị skuulu II. Ụmụ akwụkwọ isii dị iri atọ
n’ọnụọgụ na klaasị ka e ji wee mee nchọpụta a dị nari na iri abụọ. Ajụjụ nchọpụta
atọ na ụma okwu atọ bụ ihe e wepụtara wee kwado ọmụmụ nchọpụta a. A bịa
n’otu ụlọ akwụkwọ a kụziri ha sọbjektị anọ e ji usoro arụmarụ ebe a kụziri klaasị
nke ọzọ ihe ahụ site n’usoro nchịkwaba (kọntrol group). Onye nkụzi nwalere ụmụ
akwụkwọ ụzọ abụọ. Ule izizi bụ ihe e nyere ha n’ihe ha mabu ebe ha lere ule ọzọ
ebe ha mụchagoro ihe ha mabu. Ntụcha kovarians (ANCOVA) bụ ihe e ji tụchaa
akara oyi mana rizọltụ na-egosi na o nweghị ihe dị iche n’ụmụ nwoke na ụmụ
nwaanyị ụmụ akwụkwọ e ji usoro arụmarụ wee kụziere edemede Igbo na ndị e ji
usoro ọdịnala wee kụziere edemede Igbo.
O nweghị uru dị na mmekọrịta dị n’etiti usoro arụmarụ na ụmụ akwụkwọ
ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na mmụta ide edemede n’asụsụ Igbo. N’ịga
n’ihuTrudgill 1974 Wolfram 1974 kọwara na etu ụmụ nwaanyị si-ekwu okwu bụ
etu dị mma. Mana olu ụmụ nwoke na olu ụmụ nwaanyị dị iche n’obodo. Ụfọdụ
ndị odee akwụkwọ chọpụtara na e nwere ndịmiche na mmamasụsụ ya mere na
Wale 1999 mere ezigbo nchọpụta na ụmụ nwaanyị na-enwe mmasị n’asụsụ mba
ọzọ ma a bịa n’ihe gbasara ọmụmụ asụsụ karịa ụmụ nwoke. Ọtụtụ ụmụ nwaanyị
kwetere na ha ka ụmụ nwoke asụ asụsụ dị iche iche. Allerton 1967 na-akọwa na
ụmụ nwaanyị ka-amụ Lingwistiiki karịa ụmụ nwoke. Lyons 1981 na-akwado ihe
Allerton kwuru na mmasị ụmụ nwaanyị nwere n’ọmụmụ Lingwistiiki karịrị mmasị
28
ụmụ nwoke nwere. Ihe ndị nchọcha kwuru na-eme ka a mata mmekọrịta dị n’etiti
ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị kọleeji na mmamasụsụ Igbo. Onye nchọcha wee
na-achọ ịmata ebe nsogbụ dịịrị ụmụ akwụkwọ sekọndịrị skuul mmamasụsụ Igbo.
Ebe Nye Mmamasụsụ Igbo
Mmamasụsụ Igbo n’ ebe ụmụ akwụkwọ sekọndịrị skuul ime obodo nọ
abụghị idiom. Ya mere na Onyiligu, Enyemọnụ, Ime na Ọgama (1994) lebere anya
na mmamasụsụ ụtọasụsụ Igbo n’ ebe ime obodo na obodo mepere emepe n’
okpuru ọchịchị mmụta Nsụka. Ha chọpụtara na ụmụ akwụkwọ nọ n’obodo mepere
emepe ka eme nke ọma na mmamasụsụ ụtọasụsụ karịa ndị ụmụ akwụkwọ nọ n’
ime obodo. Taiwo (2000) lebekwara anya n’ime obodo na obodo mepere emepe n’
ihe gbasara mmamasụsụ. Ọ chọpụtara na ụmụ akwụkwọ ime obodo anaghị eme
nke ọma n’ihe gbasara asụsụ Igbo maka na ha na-asụkarị asụsụ epum ha n’ ụlọ
akwụkwọ.
Nchịkọta Ntulegharị
Asụsụ Igbo bụ otu n’ime asụsụ atọ e wepụtara dịka asụsụ ala Naịjirịa a ga-
akụzi n’ụlọ akwụkwọ ọtaakara, sekọndịrị, koleeji edukeshọn na mahadum. Onye
kọwara ebe ndị Igbo si bịa bụ Ọlaudah Equiano. Ọ sịrị na ndị Igbo bụ otu n’ime
ndị Juu. Ihe o ji kwado okwu ya bụ na ndị Igbo yitewere ndị Juu n’omenala dịka
ibe ugwu, ịgụ aha, ịsọ nwaanyị nọ na nsọ maọbụ nwaanyị nọ n'ọmụgọ. Ọ bụ
Ọgbalụ bụ onye chịkọbara ndị otu nkwalite asụsụ na omenala Igbo nke a na-akpọ
(SPILC). Ọ bụ ndị otu a mere na ọnọdụ Igbo na Naịjirịa nwere isi taa.
29
Asụsụ Igbo bụ ihe e ji ama onye bụ onye Igbo kpọm kwem. Ọ bụ asụsụ bụ
ihe na-enye aka mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Oge nwata akwụkwọ Igbo ga-asị na
ya maara asụsụ Igbo maọbụ ede Igbo nke ọma bụ mgbe ọ ga-asụ maọbụ ede
Igbo,onye bụ onye Igbo ga-aghọta ihe ọ na-asụ maọbụ ihe ọ na-ede.
Mmamasụsụ nwata akwụkwọ Igbo ọbụla na-esi na ndabere, gburugburu, ka
nwata ọ bụla si a mụta ihe, ụdị akwụkwọ Igbo e ji akụzịrị ya ihe, onye nkụzi ọ
makwaara ihe ịdịọm ọ na-akụzi, ngwaa nkụzi o ji akụzi ọ na-adabakwa na nkụzi
ya. A bịa n’akụkụ nke ọzọ, ụtọasụsụ bụ usoro e si asụ asụsụ n’ụzọ kwesiri ekwesi
dịka ọdịdị mkpụrụ asụsụ, ọdịdị usoro okwu na nghọta okwu. Ọ bụrụ na ụtọasụsụ
agbasoghị usoro ndị a, a mara na o nweghị isi.
Atụtụ nchọta lebekwara anya na nchọcha abụọ dịka o si gbasaba ọmụmụ
asụsụ ha bụ ndị na-amụ maka atụtụ ọkwa mmụta na atụtụ ọkwa ụbụrụ. Ndị na-
amụ maka atụtụ mmụta na-akọwa na o nweghị ihe dị nwata n’isi mgbe a mụrụ ya:
na isi ya tọgboro chakoo, na ọ bụ ihe dị na gburugburu nwata ahụ bụ ihe ọ na-
amụta. Na gburugburu nwata ahụ bụ ihe na-akụzịrị ya ka e si-ede ihe nakwa ka
esi-ekwu okwu maọbụ ka e si-eme omume.
Ndị na-amụ maka atụtụ ọkwa ụbụrụ nwata na-ekwu na Chineke kenyere
nwata ọ bụla ụbụrụ o ji amụta ihe, na ha ekwenyeghị na ndị otu na-amụ atụtụ
ọkwa mmụta, na ọbụ ihe Chineke kenyere nwata bụ ihe mere ihe o ji amụta asụsụ
tụmadị n’ihe gbasara ụtọasụsụ.
A bịa n’aka nnyochagharị nchọcha e megoro, onye nchọcha lebere anya na
nchọcha ndị ọzọ megoro banyere etu ụmụ akwụkwọ na ndị nkụzi si enwe nsogbu
30
n’ọmụmụ asụsụ Igbo. Ndị ọzọ lebekwara anya na jenda, mmamasụsụ ebe asụsụ
Igbo dị n’ebe e wuru ụlọ akwụkwọ si ebute ndaghachi azụ na mmamasụsụ ụmụ
akwụkwọ n’odide edemede Igbo.
Ka o si dị, nnyochagharị nchọcha elebaghị anya n’ụtọasụsụ kama o lebere
anya na mmamasụsụ Igbo niile. Ihe a abụrụla nnukwu nsogbu ka nsogbu nke na
onye nchọcha sịrị ka ya lebe anya n’ụtọasụsụ bụ ihe izizi nwata akwụkwọ ga-ama
tupu ọ mara ka e si agụ na ka e si ede edemede n’Igbo.
31
ISI NKE ATỌ
USORO NCHỌCHA
N’isi nke a, ihe onye nchọcha lebere anya na ha bụ ụdị nchọcha, ebe
nchọcha, ndị njirime nchọcha, nhọpụta na usoro, ngwa nchọcha, nnyocha nchọcha,
usoro nnweta ihe e ji mee nchọcha, usoro nhazi ihe nchọcha.
Ụdị Nchọcha
Ụdị nchọcha ọmụmụ a bụ ndịmemecha. Ụdị nhazị nchọcha a na-egwuzobe
nmmekọrịta mkpatarome Nworgu (1991) kwuru na onye nchọcha enweghị
nchịkwa n’ebe mgbamonwe dị n’ihe ọmụmụ. A bịa n’ihe ọmụmụ a, onye nchọcha
lebere anya etu ụmụ akwụkwọ sekọndịrị skuulu si-eme nke ọma n’ihe gbasara
ụtọasụsụ. Ya bụ mgbamonwe ụmụ akwụkwọ sekọndịrị skuulu abụghị mgbanwo
kamaọbụ ijikọta ụmụ akwụkwọ Igbo ịma ka e si-eme na ụtọasụsụ Igbo.
Ebe Nchọcha
Ebe nchọcha bụ na zonu mmụta Nsụka nke jikọtara okpuru ọchichi atọ:
Nsụka, Igbo-Etiti na Ụzọ-Ụwanị. Zoonu a nwegasịrị ụlọ akwụkwọ ime obodo na
obodo mepere emepe. Ụmụ akwụkwọ ndị sekọndịrị skuulu bi na gburugburu ahụ
na-asụ Igbo bụ epum ha tinyekwara Bekee. Onye nchọcha lebere anya na zonu
Nsụka maka na ha nwere ụlọ akwụkwọ nọ n’ime obodo na obodo mepere emepe.
Ndị “Post Primary School Management Board” Nsụka kọwara na ụlọ akwụkwọ nọ
n’obodo mepere emepe bụ ndị nọ n’ime Nsụka. Ha bụ: St. Teresa’s College
Nsukka, Nsukka High School Nsukka, Queen of the Rosary Secondry School
32
Nsukka, Urban Girls’ Secondary School Nsukka, St. Cyprain’s Science School
Nsukka, St Cyprain’s Girls School Nsukka, Model Secondary School Nsukka na
Urban Boys School Nsukka. Ndị nọ n’ime obodo bụ ụlọ akwụkwọ ndị anọghị
n’ime Nsụka. Onye nchọcha lebere anya na zonu mmụta Nsụka maka na
mmamasụsụ ha n’Igbo adịkebeghị mma.
Ndị Njirime Nchọcha
Ndị njirime nchọcha bụ ụmụ akwụkwọ siiniọ sekọndịrị skuulu II. Ụlọ
akwụkwọ dị na zonu ahụ dị (iri ise na itoolu). Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ dị (puku
anọ nari ise iri asa na isii). Usoro nchọcha njirime bụ na “Post Primary School
Management Board”, Nsụka Zoonu.
Nhọpụta Na Usoro
Mgbakọta ọnụọgụ ụlọ akwụkwọ itoolu ka a e ji nhọpụta n’usoro wee
họpụta. Okpuru ọchichi Nsụka nwere ụmụ akwụkwọ dị narị abụọ na atọ, ebe Igbo-
Etiti nwere ụmụ akwụkwọ narị iri ise na atọ, Ụzọ-Uwani narị na abụọ. Mgbakọta
ọnụọgụ ụmụ akwụkwọ dị narị anọ iri ise na asatọ. Ya bụ pesent iri n’ime ụlọ
akwụkwọ a ka e ji nhọpụta na usoro wee họpụta ụmụ akwụkwọ.
Ngwa Nchọcha
Nnwale ka e ji nweta ngwa nchọcha. Nnwale mmamasụsụ n’Igbo ka e ji
ngwaa nchọcha wee nweta ule ụmụ akwụkwọ. Ule ahụ dị nkeji ise.
33
(a) Nkeji mbụ nwere ajụjụ iri na-akọwa maka ọrụ ‘na’ na-arụ dịka njiko,
nnyemaka ngwaa, mbuụzọ; ọrụ ‘ga’ na-arụ dịka nnyemaka ngwaa; ọrụ ‘ka’
na ‘kwa’ na-arụ. Ha ga-ahọrọ azịzị n’igbe wee mejuo oghere dị n’ahịrịokwu.
(b) Nkeji abụọ nwere ajụjụ iri na-akọwa maka akara ụdaolu. Onye nchọcha
depụtara okwu atọ yiri onwe ha, tinye ha akara ụda, ụmụ akwụkwọ ga-ewere
akara ụda ya dabara n’ime okwu atọ ahụ nke bụ ansa.
(ch) Nkeji nke atọ nwere ajụjụ iri na-akọwa maka ndezi okwu Igbo nke ọma.
Onye nchọcha degharịrị okwu atọ yiri ma sị ụmụ akwụkwọ ka ha were nke e
deziri nke ọma n’ime okwu atọ ahụ.
(d) Nkeji anọ nwere ajụjụ iri na-akọwa maka ụdaume, mgbochiume, myiri-
ụdaume, asịpeekịtị. Ụmụ akwụkwọ ga-achọrọ otu azịza dị mma n’ime ajụjụ
atọ e depụtara.
(e) Nkeji ise nwere ajụjụ iri na-akọwa maka mọfịm. Onye nchọcha depụtara
ajụjụ atọ ka ụmụ akwụkwọ họrọ azịza dị mma.
Mgbakọta ọnụọgụ ajụjụ dị iri ise.
Nnyocha Nchọcha
Ndị nkụzi abụọ na-akụzi na ngalaba Igbo Language Edukeshọn na otu onye
nkụzi na-akụzi na ngalaba Ntu Nlele bụ ndị lebere anya na nnyocha ngwa
nchọcha. Ha niile na-akụzi na Mahadum Naịjirịa. Ndị nkụzi nnyocha ngwa
nchọcha ka a rịọrọ ka ha lebe anya n’asụsụ nnyocha nchọcha, ngwa ajụjụ a jụrụ ha
34
adabara n’ebunuche ihe ọmụmụ a? Ndị nkụzi kwenyere na nkwado ngwa dabara
n’ebunuche ihe ọmụmụ a.
Usoro Nnweta Ihe E Ji Mee Nchọcha
Usoro nweta ihe e ji mee nchọcha bụ nnwale onye nchọcha nyere ụmụ
akwụkwọ a na-akpọ “Nnwale onye Nkụzi”. Nnwale a rụtụchara aka n’ihe niile a
na-akụziri ụmụ akwụkwọ n’ụtọasụsụ. Ha ga-ewere azịza n’igbe wee mejuo oghere
dị n’ahịrịokwu. Nnwale a bụ e lelecha e legharịkwa ka e ji wee chọpụta etu ụmụ
akwụkwọ sekọndịrị Igbo si eme nke ọma n’ụtọasụsụ. Ịma ma usoro nnweta ihe
nchọcha bụ ezigbo ngwa, onye nchọcha enye ngwa ụmụ akwụkwọ dị iri abụọ
n’ọnụọgụ (SSS II) dị n’Obolo-Afọ Zonu Mmụta. Ngwa nchọcha e nwetara bụ ihe
e ji ntụcha data a na-akpọ K-R 20 wee mee. Ihe e nwetara na adịmụmma ngwa bụ
0.91. Ọ na-egosi na adịmụmma ngwa dabara adaba.
Usoro Nhazi Nchọcha
Usoro nchọcha ihe ọmụmụ bụ ntụcha nke e ji pesenti wee mee. Nọmba dị
mma nwere akara abụọ nke na mgbakọta akara niile dị mma bụ nari akara n’ime
ajụjụ iri ise a jụrụ. Pesenti bụ ihe e ji zaa ajụjụ nchọcha. Pesenti narị maọbụ karịa
ka a ga-anabata dịka mgbamonwe ebe nke ọbụla pekarịrị narị ka a gaghị anabata.
35
ISI NKE ANỌ
USORO NHAZI NTỤCHA DATA
N’isi nke a, ihe onye nchọcha lebere anya na ya bụ ka ụmụ akwụkwọ dị
narị anọ iri ise na asatọ na Nsụka Edukeshọn zonu si zaa ajụjụ e nyere ha. E so
usoro pesenti wee chọpụta ihe ndị a:
Ụmụ akwụkwọ na-asụ asụsụ epum ha ka ha si eme nke ọma n’ụtọasụsụ,
Ka jenda si emetuta mmeta nke ọma n’ule asụsụ Igbo,
Ndịmiche dị na nzata ndị bi n’ime obodo na obodo mepere emepe n’ihe
gbasara ụtọasụsụ nakwa ụtọasụsụ ha ka eme nke ọma.
N’ime ajụjụ narị anọ iri ise na asatọ onye nchọcha kere ụmụ akwụkwọ, ihe
onye nchọcha kpoghachitara azụ dịmma bụ narị anọ iri atọ na otu. Otu a ka rịzọltụ
ha is dị
Ụmụakwụkwọ Ụmụ Nwoke na Ụmụ Nwaanyị lere ule is
Tebul a na-egosi ka ụmụ akwụkwọ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị si-eme nke ọma
n’ụtọ asụsụ
Jenda Ndị zara Ajụjụ Pesenti
ụmụ nwoke 240 55.7%
ụmụ nwaanyị 191 44.3%
Ngbakọta ọnụọgụ 431 100.0%
Ụmụ nwoke zara ajụjụ dị narị abụọ na iri anọ pesenti ha bụ 55.7% ebe ụmụ
nwaanyị zara ajụjụ dị narị iri itoolu na otu pesenti ha bụ 44.3%. Mgbakọta ọnụọgụ
36
ụmụ akwụkwọ zara ajụjụ dị narị anọ iri atọ na otu. E lee anya a hụ na ụmụ nwoke
ka n’ọnụọgụ n’ime ụlọ akwụkwọ onye nchọcha ji wee me nchọcha.
Ajụjụ Nchọcha
a) Kedu ka ụmụ akwụkwọ na-asụ asụsụ epum ha si eme nke ọma n’ụtọasụsụ?
Ndị Na-Asụ Asụsụ Igbo
Tebulu a na-egosi ka ụmụ akwụkwọ na-asụ asụsụ epum ha si-eme nke ọma
n’ụtọasụsụ
Larịị Mmasmasụsụ Larịị Asụsụ Igbo Mgbakọta Ọnụọgụ
Ndị mere nke ọma
Ndị emeghị
nke ọma
Ndị mere nke ọma ọnụọgụ pesenti
19 4.4%
221 51.3%
240 55.7%
Ndị emeghị nke ọma ọnụọgụ pesenti
189 43.9%
2 5%
191 44.3%
Mgbakọta ọnụọgụ ọnụọgụ pesenti
208 48.3%
223 51%
431 100.0%
E lee anya na tebulu a, a hụ na ụmụ akwụkwọ lere ule dị narị anọ iri atọ na
otu. N’ime ọnụọgụ ụmụ akwụkwọ a, e kere ha ụzọ abụọ ndị otu ‘A’ na ndị otu ‘B’.
A bịa na ndị otu ‘A’ e kekwara ha ụzọ abụọ. Otu ahụ ka ọ dị ndị otu ‘B’. Ihe e ji
mee nke a bụ ịmata nke ọma ka ndị na-asụ asụsụ epum ha si eme nke ọma
n’ụtọasụsụ. A bịa na ndị otu ‘A’ ndị mere nke ọma dị iri na itoolu ebe ndị emeghị
nke ọma dị narị abụọ iri abụọ na otu. Mgbakọta ọnụọgụ ndị lere ule na ndị otu ‘A’
dị narị abụọ iri anọ. Ndị mere nke ọma na ndị otu ‘B dị narị iri asatọ na itoolu ebe
37
ndị emeghị nke ọma dị abụọ. Mgbakọta ọnụọgụ ndị lere ule na ndị otu ‘B’ dị narị
iri itoolu na otu. Mgbakọta ọnụọgụ ndị mere nke ọma n’ụmụ akwụkwọ ndị lere ule
dị narị abụọ na asatọ ebe ndị emeghị nke ọma dị narị abụọ iri abụọ na otu.
Ya bụ na ụmụ akwụkwọ na-asụ asụsụ epum ha anaghị eme nke ọma
n’ụtọasụsụ niihi na ha enweghị mmasị n’asụsụ epum ha. Ha chere na o nweghị ebe
asụsụ epum ha ga-eduga ha.
b) Kedu ka jenda si emetụta mmeta nke ọma n’ule asụsụ Igbo?
Ụmụ Nwoke na Ụmụ Nwanyị lere ule
Tebul a na-egosi ndị ka eme nke ọma n’ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị n’ụtọasụsụ
Larịị Mmasmasụsụ Jenda Nwoke Nwaanyị Mgbakọta
ọnụọgụ Ndị mere nke ọma ọnụọgụ
pesenti 106 44.5%
134 76.4%
240 55.7%
Ndị emeghị nke ọma
ọnụọgụ pesenti
106 44.5%
85 44.2%
191 44.3%
Mgbakọta ọnụọgụ ọnụọgụ pesenti
212 100.0%
219 100.0%
431 100.0%
Mgbakọta ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị lere ule dị narị anọ iri atọ na otu. Ụmụ
nwoke dị narị abụọ na iri anọ, ebe ụmụ nwaanyị dị narị iri itoolu na otu. Ụlọ
akwụkwọ ụmụ nwoke karịrị n’ọnụọgụ ya mere ụmụ nwoke jiri karịa ụmụ nwaanyị
lere ule. A bịa n’ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị, e kere ha ụzọ abụọ abụọ. E mere
nke a iji mara ndị ka eme nke ọma n’ụtọasụsụ. E lee anya na tebul a hụ na ụmụ
nwoke mere nke ọma dị narị na isii, ebe ndị emeghị nke ọma dị narị na isii. Ụmụ
38
nwaanyị mere nke ọma dị narị iri atọ na anọ, ebe ndị emeghị nke ọma iri asatọ na
ise.
E lee anya ahụ na ụmụ nwaanyị ka ụmụ nwoke mee nke ọma. Rizọltụ ha
na-egosi na ụmụ nwaanyị ka eme nke ọma n’ụtọasụsụ karịa ụmụ nwoke.
ch) Ajụjụ nke Atọ: Kedu akụkụ ụtọasụsụ ụmụ akwụkwọ ka-enwe nsogbu?
Tebul a na-egosi akụkụ ụtọasụsụ ụmụ akwụkwọ ka enwe nsogbu.
Nkeji Ọnụọgụ ndi lere ule
Pesenti Ọnọdụ Rizọltụ
Nkeji A 431 0.3% 4th A nabataghị
Nkeji B 431 0.2% 5th A nabataghị
Nkeji CH 431 0.6% 3rd A nabatara
Nkeji D 431 0.7% 2nd A nabatara
Nkeji E 431 0.9% 1st A nabatara
Na tebul a, a ga-ahụ na pesenti ‘A’ bụ 0.3%, ‘B’ 0.2%, ‘CH’ 0.6%, ‘D’ 0.75%, ebe
‘E’ bn 0.96%. Na mkpokọta okwu a hụ na ụtọasụsụ ụmụ akwụkwọ ka enwe
nsogbu na ya bụ ọrụ ‘na’, ‘ga’, ‘ka’, ‘kwa’, na-arụ n’ahịrịokwu ya na itinye akara
ụdaolu n’okwu nwere otu nsupe.
Nke D: Kedu ndịịche dị na nzata ndị bi n’ime obodo na obodo mepere emepe
n’ụtọasụsụ
Ụlọ Akwụkwọ
39
Tebul a na-egosi na ụmụ akwụkwọ bi n’ime obodo ka eme nke ọma n’ụtọasụsụ
karịa ụmụ akwụkwọ ndị bi n’obodo mepere emepe
Larịị mmasmasụsụ Obodo Mepere Emepe
Ime Obodo
Mgbakọta Ọnụọgụ
Ndị mere nke ọma ọnụọgụ pesenti
116 48.5%
124 64.6%
240 55.7%
Ndị emeghị nke ọma
ọnụọgụ pesenti
123 51.5%
68 35.4%
191 44.3%
Mgbakọta ọnụọgụ ọnụọgụ pesenti
239 100.0%
129 100.0%
431 100.0%
Ọnụọgụ ụmụ akwụkwọ lere ule n’obodo mepere emepe dị narị abụọ iri atọ na
itoolu. Ebe ndị ime obodo dị narị iri itoolu na abụọ. Mgbakọta ọnụọgụ ha dị narị
atọ iri atọ na otu. Ndị mere nke ọma n’obodo mepere emepe dị narị iri na isii, ebe
ndị emeghị nke ọma dị narị iri abụọ na atọ. Ndị mere nke ọma n’ime obodo dị narị
iri na isii, ebe ndị emeghị nke ọma dị narị iri abụọ na atọ. Ndị mere nke ọma n’ime
obodo dị narị iri abụọ na anọ, ebe ndị emeghị nke ọma dị iri isii na asatọ.
Site na rizọlt dị na tebul, a ga-ahụ na ndị bi n’obodo mepere emepe emeghị
nke ọma n’ụtọasụsụ niihi na Bekee ka e ji akụziri ha ihe karịa Igbo ma ụmụ
akwụkwọ ka asụ Bekee karịa Igbo.
40
Ajụjụ E: Kedu akụkụ ụtọasụsụ ụmụ akwụkwọ ka eme nke ọma?
Tebul a na-egosi mpaghara ụtọasụsụ ụmụ akwụkwọ ka eme nke ọma na ya.
Nkeji Ọnụọgụ ndị lere Ule
Pesenti Ọnọdụ Rizọlt
A 431 0.3 4th A nabataghị B 431 0.2% 5th A nabataghị CH 431 0.6% 3rd A nabatara D 431 0.75% 2nd A nabatara E 431 0.9% 1st A nabatara
Rizọlt a na-egosi na ụtọasụsụ ụmụ akwụkwọ ka eme nke ọma bụ ndezi okwu Igbo
nke ọma, ụdaume na mgbochiume, myiriụdaume na asịpekịtị na mọfịm
Ụlọ akwụkwọ e ji wee mee nchọcha
Ụlọ Akwụkwọ Ndị Zara Azịza Pesenti QRSS Nsụka 48 11.1% STC Nsụka 48 11.1% H.N.S Nsụka 51 11.8% St. Cyprian Girls 45 10.4% Akụ Boys 47 10.9% CSS Ohobe Dim 48 11.1% USS Adani 46 10.7% CSS Ohodo 51 11.8% Ugbene Ajima 47 10.9% Mgbakọta ọnụọgụ 431 100.0%
Nchịkọta Usoro Nhazị Ntụcha Data
A bịa n’usoro nhazi ntụcha data, ajụjụ onye nchọcha jụrụ ụmụ akwụkwọ dị
iri ise. Ajụjụ a nwere nkeji ise, n’ime nkeji ọbụla nwere ajụjụ iri. Onye nchọcha
jiri pesenti ọbụla wee chọpụta ka ụmụ akwụkwọ si-eme nke ọma n’ụtọasụsụ.
41
Ajụjụ ‘A’ lebere anya ka ụmụ akwụkwọ na-asụ asụsụ ha si eme nke ọma
n’ụtọasụsụ site na rizọọlt e nwetara na-egosi na ụmụ akwụkwọ anaghị eme nke
ọma n’asụsụ epum ha n’ihi na ha enweghị mmasị na’asụsụ epum ha maka na onye
ọbụla chọzịrị ịbụ onye Bekee.
Ajụjụ nke Atọ:
Kedu akụkụ ụtọasụsụ ụmụ akwụkwọ ka-enwe nsogbu?
Site na rizọọlt ka onye nchọcha chọpụtara na ọrụ ‘na’, ‘ga’, ‘ka’, ‘kwa’ na-
arụ n’ahịrịrokwu na itinye akara ụdaolu n’okwu nwere otu nsupe ka enye ha
nsogbu.
Ajụjụ Nke Anọ:
Kedu ndịmiche di na nzata ndị bi n’ime obodo na obodo mepere emepe
n’ụtọasụsụ? Rizọlt na-egosi na ndị bi n’ime obodo ka-eme nke ọma n’ụtọasụsụ
karịa ndị bi n’obodo mepere emepe niihi na ndị bi n’ime obodo ka-asụ asụsụ Igbo
n’ụlọ akwụkwọ na n’ụlọ ha. Ma ndị bi n’obodo mepere emepe ka-asụ asụsụ Bekee
n’ụlọ akwụkwọ na ụ’ụlọ ha.
Ajụjụ Nkee:
Kedu akụkụ ụtọasụsụ ụmụ akwụkwọ ka-eme nke ọma?
Na rizọọlt ha ka onye nchọcha chọpụtara na ụtọasụsụ ha ka-eme nke ọma bụ ndezi
okwu Igbo, ụdaume, mgbochiume, myiri, asipikịtị na mọfịm.
42
ISI NKE ISE
NHAZI IHE ACHỌPỤTARA
Isi nke a na-eleba anya na rizọọlt e nwetara n’ihe ọmụmụ a. Ihe ọmụmụ a
gbadoro ụkwụ na rizọọlt nhazi ntụcha data e mere n’isi nke anọ. Usoro a ka a ga-
esi wee ga:
Nkata, mkpokọta, ihe ga-apụta, atụmatụ maka nchọcha ọdịnịhu, ebe nchọcha
kwụsịrị, ebe ndị ọzọ chọrọ ime nchọcha
Nkata
Nkata na nkọwa ihe onye nchọcha chọpụtara ga-agbado ụkwụ n’ajụjụ
nchọcha.
Ajụjụ Nchọcha nke Mbụ:
Kedu ka ụmụ akwụkwọ na-asụ asụsụ epum ha si eme nke ọma n’ụtọasụsụ?
A bịa na tebul mbụ a hụ na mgbakọta ọnụọgụ ụmụ akwụkwọ mere nke ọma dị narị
abụọ na asatọ nke pesentị ya bụ 48.3%, ebe ndị emeghị nke ọma dị narị abụọ iri
abụọ na otu pesentị ya bụ 51%. Nke a na-egosi na ụmụ akwụkwọ na-asụ asụsụ
epum ha anaghị eme nke ọma n’ụtọasụsụ na Nsụka Edukeshọn zoonu. Ihe kpatara
nke a bụ na ụmụ akwụkwọ amaghị uru asụsụ bara. Dịka Mgbodile (1999) kọwara,
asụsụ n’usoro mmụta edukeshọn bụ ịghọta ihe asụsụ bụ na uru ọ bara na
mmekọrịta mmadụ na ibe ya.
Ajụjụ nchọcha nke abụọ:
43
Kedu ka jenda si emetuta mmeta nke ọma n’ule asụsụ Igbo?
Mgbakọta ọnụọgụ ụmụ nwoke mere nke ọma dị narị na isii, ebe ụmụ
nwaanyị mere nke ọma dị narị iri atọ na anọ. Ụmụ nwaanyị ka mee nke ọma
n’ụtọasụsụ karịa ụmụ nwoke. Ihe a na-egosi na ụmụ nwaanyị ka nwee mmasị
n’ụtọasụsụ karịa ụmụ nwoke. Rizọọlt a kwenyere n’ihe Allerton 1967 na Lyons
1981 kọwara na ụmụ nwaanyị ka-enwe mmasị n’ọmụmụ lingwistiiki karịa ụmụ
nwoke.
Ajụjụ nchọcha nke Atọ:
Kedu akụkụ ụtọasụsụ ụmụ akwụkwọ ka enwe nsogbu?
Na tebul nke atọ, pesenti ka e ji wee chọpụta ụtọasụsụ ụmụ akwụkwọ ka
enwe nsogbu. Na nkeji ‘A’ ihe a na-akọwa ebe ahụ bụ ọrụ ‘na’, ‘ga’, ‘ka’, ‘kwa’,
na-arụ n’ahịrịokwu. Ọ na-enye ụmụ akwụkwọ nsogbu itinye ha nke ọma
n’ahịrịokwu ya mere na pesenti ha nwere na ya bụ 0.3% bụ nke onye nchọcha
anabataghị. Ụtọasụsụ ọzọ na-enyekwa ha nsogbu bụ itinye akara ụdaolu n’okwu
nwere otu nsupe. Pesenti ha nwere ebe ahụ bụ 0.2% bụ nke a nabataghị. Emenanjọ
(1978) na-akọwa na ihe na-enyekarị ụmụ akwụkwọ nsogbụ n’ụtọasụsụ bụ ụdaolu
niihi na ihe e ji mara okwu Igbo bụ ụdaolu ma a bịa na Bekee ọ dịghị etu ahụ.
Ajụjụ nke Anọ:
Kedu ndịịche dị na nzata ndị bi n’ime obodo na obodo mepere emepe?
Tebul nke anọ na-egosi na ụmụ akwụkwọ bi n’ime obodo ka-eme nke ọma
n’ụtọasụsụ karịa ndị bi n’obodo mepere emepe. Ụmụ akwụkwọ bi n’ime obodo
44
mere nke ọma dị narị iri abụọ na anọ ebe ndị bi n’obodo mepere emepe mere nke
ọma dị narị iri na isii. Rizọọlt ha na-egosi na ndị bi n’ime obodo ka-eme nke ọma
n’ụtọasụsụ karịa ndị bi n’obodo mepere emepe. Ihe mere ndị ime obodo na-eme
nke ọma n’ụtọasụsụ bụ na ha na-asụkarị asụsụ Igbo n’ụlọ na n’ụlọ akwụkwọ. Ndị
Mịnịistrị keedukeshọn (2004) kwuru sị na bido n’akwụkwọ ọtaakara ruo
n’akwụkwọ nke atọ ka a ga-eji asụsụ epum nwata akuziri ya ihe ma asụsụ Bekee
ga-abịa mgbe ọ bụ Bekee.
Ajụjụ nke Ise:
Kedu ụtọasụsụ ha ka eme nke ọma?
Tebul nke ise na-egosi na ụtọasụsụ ụmụ akwụkwọ ka-eme nke ọma bụ ụdaume,
mgbchiume, asịpetịtị na mọfịm. Pesenti ha nwere na ha bụ 0.6%, 0.75%, 0.9% bụ
ihe nke onye nchọcha nabatara.
Mkpokọta
Site na nhazi ntụcha data onye nchọcha mere, onye nchọcha chọpụtara na
nsogbu dịịrị ụmụ akwụkwọ sekọndịrị na mmeta nke ọma n’ụtọasụsụ n’ule
sekọndịrị skuul na Nsụka Edukeshọn zoonu. Nsogbu ha na mmeta nke ọma
n’ụtọasụsụ bụ na ụmụ akwụkwọ eweghị asụsụ Igbo kpọrọ ihe. Ọtụtụ nne na nna
ekweghị ka ụmụ ha na-asụ Igbo n’ụlọ ha nke e ji akpọ asụsụ Igbo a kụziiri ha ihe
n’ụlọ akwụkwọ. Niihi nke a, ndị Igbo na-ekwu sị ka omume nwata dị n’ụlọ ka ọ
na-ebupụta n’ama. Ndị isi ụlọ akwụkwọ anaghị elebe anya ma a na-akụzi asụsụ
Igbo mgbe o kwesịrị.
45
Onye nchọcha chọpụtara na ụmụ nwaanyị ka-eme nke ọma n’ụtọasụsụ
karịa ụmụ nwoke. Iji kwado ihe a ka Allerton (1969) na Lyons (1981) kọwara na
ụmụ nwaanyị ka ụmụ nwoke nwee mmasị n’ọmụmụ lingwistiiki. Ụtọasụsụ na-
enye ụmụ akwụkwọ nsogbu si n’aka ndị nkụzi. Ndị nkụzi na-eji Bekee akọwara
ụmụaka ihe n’Igbo ma akwụkwọ ha ji akụziri ha ihe ka e dere na Bekee. Iji kwado
ihe a ka Ezeuko (2000) kọwara na tupu ụmụ akwụkwọ emee nke ọma n’ụtọasụsụ,
na ndị nkụzi ga-ebido n’akwụkwọ ọtaakara kuzibere ụmụaka asụsụ Igbo.
Ekechukwu (2004) kwadoro ihe Ezeuko kwuru na ime ka ụmụ akwụkwọ mee nke
ọma n’ụtọasụsụ ga-esi n’aka ndị nkụzi a zụrụ azụ n’asụsụ Igbo. Ndị bi n’ime
obodo ka ndị bi n’obodo mepere emepe eme nke ọma n’ụtọasụsụ. Site na nhazi
ntụcha data onye nchọcha mere ka ọ chọpụtara na ụmụ akwụkwọ anaghị emeta
nke ọma n’ụtọasụsụ na Nsụka Edukeshọn zoonu.
Ihe Ga-Apụta
Rizọọlt onye nchọcha mere na-egosi na mmeta nke ọma ụmụ akwụkwọ
n’ule sekọndịrị skuul si n’aka ndị a: gọọmentị, ndị isi ụlọ akwụkwọ, ndị nne na
nna, ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ.
Aka nke ndị gọọmentị na-egosi na a bịa n’iwe n’ọrụ na ha anaghị elebe
anya iwe ndị mụrụ maka asụsụ Igbo tinye ha n’ụlọ akwụkwọ sekọndịrị. Nke a na-
eme na a bịa n’ụlọ akwụkwọ ndị sekọndịrị na Nsụka Edukeshọn zoonu, ndị na-
akụzi asụsụ Igbo pere mpe. Ya bụ na ndị gọọmentị etiti ga elebe anya iwe ndị
46
mụrụ maka asụsụ Igbo tinye ha n’ụlọ akwụkwọ sekọndịrị skuul niile dị na Nsụka
Edukeshọn zoonu maka mmeta nke ọma n’ụtọasụsụ.
Ndị isi ụlọ akwụkwọ ga-ahụ na oge e nyere maka nkụzi asụsụ Igbo na-aga
nke ọma. Ha ga-eme ka a kwụsị ịnara nwata akwụkwọ sụrụ Igbo n’ụlọ akwụkwọ
nha. Nke a ga-eme ka nwata akwụkwọ mata na asụsụ Igbo dịkwa mkpa dịka asụsụ
ndị ọzọ a na-amụ n’ụlọ akwụkwọ. Ndị nne na nna ga-agba mbọ hụ na ụmụ ha ga
na-asụ Igbo n’ụlọ ma aka inwe mmasị n’ọmụmụ asụsụ Igbo n’ụlọ akwụkwọ.
N’akụkụ nke ọzọ, ndị nkụzi na-akụzi asụsụ Igbo ga na-aga ọgbakọ maọbụ
nchọcha dị iche iche iji mara mgbanwo ụfọdụ e mere n’asụsụ Igbo. Nke a ga-eme
ka ụkwụ sie ha ike n’ikụziri ụmụ akwụkwọ asụsụ Igbo nke ọma. Egwuregwu Igbo
a na-eme n’onyonyo ga-abụ asụsụ Igbo ka a ga-eji egosipụta ya. Asụsụ Igbo ga-
aba n’ọgbara ọhụụ ndị Bekee kpọrọ kọmputa. Mgbe ihe ndị a na-eme, ụmụ
akwụkwọ ejiri akọnauche ha mara na asụsụ Igbo dị mkpa dịka asụsụ ndị ọzọ a na-
akụziri ha n’ụlọ akwụkwọ.
Site n’ihe onye nchọcha chọpụtara, ka o kwenyere na ọ bụrụ na e soro ụzọ
ndị a, asụsụ Igbo ga-agba mgbọrọgwụ mee ka a kwalite asụsụ na omenala Igbo.
Atụmatụ Maka Nchọcha Ọdịnihu
Inye aka nkwalite asụsụ na omenala Igbo n’ụlọ akwụkwọ sekọndịrị skuul
na Nsụka Edukeshọn zoonu, na gọọmentị etiti nakwa Nịajirịa niile, ihe ndị a ka
onye nchọcha gbadoro ụkwụ site n’ihe nchọpụta o mere.
47
(a) Ndị nkụzi ga-ebido kuzibere ụmụ akwụkwọ Igbo bido n’akwụkwọ
ọtaakara ruo na sekọndịrị ma ụlọ akwụkwọ ndị nwe onwe ha maọbụ nke
gọọmentị.
(b) Ndị nne na nna ga-akwadoro ụmụ ha ịsụ asụsụ Igbo n’ụlọ ma nwee
mmasị maka ụmụ ha ịmụ ya n’ụlọ akwụkwọ.
(ch) Akwụkwọ e ji akụziri ụmụ akwụkwọ ihe ga na-abụ Igbo ka e ji ede ya. Ọ
bụghị e dee na Bekee, e jiri Igbo kuzibe.
(d) Ndị nkụzi ga-aga ọgbakọ maọbụ mee nchọcha gbasara mgbanwe dị
n’asụsụ Igbo.
(e) Ndị Igbo ga-eji asụsụ ha anya isi site n’ịsụ asụsụ Igbo ebe ọbụla ha
gbakọrọ ọnụ
(f) Onye chọrọ ịmụ maka asụsụ Igbo n’ụlọ akwụkwọ dị elu a ga-akwado ya
site n’inye ya ọzụzụ n’efu. Nke a ga-eme ka ụmụ aka na-etinye uchu
n’ọmụmụ asụsụ Igbo.
Ebe Nchọcha Kwụsịrị
Onye nchọcha mere ka ọ rụtụcha aka ụlọ akwụkwọ niile dị na Nsụka
Edukeshọn zonu ma dịka otu ihe sịrị kwụrụ o nweghị ike maka oge na okpogho e
ji eme ya. Ya ka onye nchọcha ji kpebie ka ya leba anya n’ụlọ akwụkwọ itoolu dị
na Nsụka Edukeshọn zoonu. Rizọọlt e nwetara n’ụlọ akwụkwọ ndị a bụ ihe e ji
atụnyere ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ dị na zoonu ahụ.
48
Ebe Ndị Ọzọ e nwere ike Ime Nchọcha
Rizọọlt nchọcha a nwekwara ike ilebe anya n’edukeshọn zoonu ọzọ abụghị
Nsụka Edukeshọn zoonu. E nwekwara ike ilebe ya anya n’ụdị a
(a) Mmeta nke ọma n’ụtọasụsụ n’ule ụmụ akwụkwọ ndị sekọndịrị skuul n’afọ
ndị ọzọ gara aga.
(b) Ihe mere na ụmụ akwụkwọ Igbo enweghị mmasị n’asụsụs Igbo.
(ch) Etu a ga-esi eme ka a kwalite ọmụmụ asụsụ Igbo n’ụlọ akwụkwọ Igbo
niile dị na Nịajirịa
Nchịkọta
Ihe ọmụmụ a bụ maka mmeta nke ọma n’ụtọasụsụ n’ule sekọndịrị na Nsụka
Edukeshọn zoonu. Onye nchọcha lebere anya na ntulegharị ndị ọzọ mere bụ ndị
yitabalụ ihe ọmụmụ a na nsogbu ụmụ akwụkwọ na-enwe n’ọmụmụ asụsụ Igbo
dịka onyeisi ụlọ akwụkwọ anaghị akwado nkụzi asụsụ Igbo; oge e nyere nkụzi
asụsụ Igbo pere mpe; ọtụtụ nne na nna anaghị asụrụ ụmụ ha Igbo n’ụlọ, naanị
Bekee ka ha na-asụ n’ụlọ ha; mgbanwo akwụkwọ ọgụgụ Igbo oge ọbụla na-enye
nsogbu; ndị odee akwụkwọ ji Bekee ede asụsụ Igbo; olundị karịrị na Nsụka;
nsogbu n’ịkpọpụta mkpụrụ edide nke ọma; nakwa enweghị ndị nkụzi a zụrụ
n’Igbo na-akụzi asụsụ Igbo nke ọma.
Ihe e ji wee mee nchọcha bụ ụmụ akwụkwọ dị narị anọ iri ise na asatọ. Ụlọ
akwụkwọ dị na Nsụka Edukeshọn zoonu dị iri ise na itoolu. N’ime ụlọ akwụkwọ a
ka onye nchọcha jiri ụlọ akwụkwọ itoolu wee mee nchọcha.
49
Usoro nnweta ihe e ji wee mee nchọcha bụ nnwale onye nchọcha nyere
ụmụ akwụkwọ nke ndị nkụzi atọ n’ụlọ akwụkwọ Mahadum Nsụka nyochachara
kwekorịta na ọdị mma.
Ajụjụ onye nchọcha nyere ụmụ akwụkwọ bụ ihe ọ natara n’aka. Nke a na-
egosi na ọ natazuru ụmụ akwụkwọ ule o nyere ha. Usoro nhazi ntụcha data ka a
haziri wee chọpụta na tebul mbụ na ụmụ akwụkwọ na-asụ asụsụ epum ha anaghị
eme nke ọma n’ụtọasụsụ. Ihe kpatara ya bụ na ụmụ akwụkwọ enweghị mmasị
n’asụsụ epum ha.
Tebul nke abụọ na-egosi na ụmụ nwaanyị ka-eme nke ọma n’ụtọasụsụ karịa
ụmụ nwoke. Ihe mere nke a bụ na ụmụ nwoke na-achọ ịmụ maka ịbụ njịnịa nakwa
ọkaikpe na dọkịta. Niihi ya, ha enweghị mmasị n’ọmụmụ ụtọasụsụ.
Tebul nke atọ na-akọwa na n’ụtọasụsụ ụmụ akwụkwọ anaghị eme nke ọma
niihi na ha amaghị ọrụ ‘na’, ‘ga’, ‘ka’, ‘kwa’ na-arụ n’ahịrịokwu ya na itinye akara
ụdaolu n’okwu nwere otu nsupe. Pesenti ha na-enweta na ya bụ 0.3% na 0.2%. Ihe
kpatara ya bụ na e bidoghị n’oge kuzibere ha ụtọasụsụ.
Tebul nke anọ na-egosi na ndị bi n’ime obodo ka-eme nke ọma n’ụtọasụsụ
karịa ndị bi n’obodo mpere emepe. Ihe kpatara ya bụ na ndị bi n’ime obodo na-
ejikarị asụsụ Igbo akụzi ihe karịa ndị bi n’obodo mepere emepe.
Tebul nke ise na-egosi na ụtọasụsụ ụmụ akwụkwọ ka-eme nke ọma na ya
bụ ụdaume, mgbochiume, myiri, asịpekịtị na mọfịm. Pesenti ha nwetara na ha bụ
0.6%, 0.75% na 0.9% bụ nke onye nchọcha nabatara. Maka na ụmụ akwụkwọ
50
enweghị mmasị n’asụsụ Igbo ka onye nchọcha ji wee leba anya na mmeta nke ọma
n’ụtọasụsụ n’ule sekọndịrị.
Mbịa Mbịakwa Mmereme
Ụlọ akwụkwọ
Jenda Ebe ụlọ akwụkwọ
dị
Ka ha si eme nke ọma
Nkeji A ka esi
eme nke ọma
Nkeji B ka e si eme nke
ọma
Ọnụọgụ dị mma
431 431 431 431 431 431
Nke furu efu 0 0 0 0 0 0 Mmereme Nkeji ‘ch’ ka e si
mee nke ọma Nkeji “D’ ka e si
mee nke ọma Nkeji ‘E’ ka e si mee
nke ọma Ọnụọgụ dị mma
431 431 431
Nke furu efu 0 0 0 Ụlọ Akwụkwọ Mbịa
mbịakwa Pesenti Pesenti dị
mma Mkpokọta ọnụọgụ pesenti
QRSS Nsụka 48 11.1 11.1 11.1 STC Nsụka 48 11.1 11.1 22.3 H.N.S Nsụka 51 11.8 11.8 34.1 St. Cyprian Girls
45 10.4 10.4 44.5
Akụ Boys 47 10.9 10.9 55.5 CSS Ohobe Dim 48 11.1 11.1 66.6 USS Adani 46 10.7 10.7 77.3 CSS Ohodo 51 11.8 11.8 89.1 Ugbene Ajima 47 10.9 10.9 100.0 Mgbakọta ọnụọgụ
431 100.0 100.0
51
Jenda Mbịa
Mbịakwa Pesenti Pesenti dị
mma Mkpokọba ọnụọgụ pesenti
ụmụ nwoke 240 55l7 55.7 55.7 ụmụ nwaanyị 191 44.3 44.3 100.0 Mkpakota ọnụọgụ 431 100.0 100.0 Ebe Ụlọ Akwụkwọ dị Mbịa
Mbịakwa Pesenti Pesenti dị
mma Mkpokọba ọnụọgụ pesenti
Obodo mepere emepe
192 44.5 44.5 44.5
Ime obodo 239 55.5 55.5 100.0 Mkpakota ọnụọgụ 431 100.0 100.0
Mmamasụsụ Mbịa
Mbịakwa Pesenti Pesenti dị
mma Mkpokọba ọnụọgụ pesenti
Ndị emeghị nke ọma 191 44.3 44.3 44.3 Ndị mere nke ọma 240 55.7 55.7 100.0 Mkpakota ọnụọgu 431 100.0 100.0
Mmamasụsụ Nkeji ‘A’ Mbịa
Mbịakwa Pesenti Pesenti dị
mma Mkpokọba ọnụọgụ pesenti
Ndị emeghị nke ọma
227 52.7 52.7 52.7
Ndị mere nke ọma 204 47.3 47.3 100.0 Mkpakota ọnụọgụ 431 100.0 100.0
Mmamasụsụ Nkeji ‘B’ Mbịa
Mbịakwa Pesenti Pesenti dị
mma Mkpokọba ọnụọgụ pesenti
Ndị emeghị nke ọma
320 74.2 74.2 74.2
Ndị mere nke ọma 111 25.8 25.8 100.0 Mkpakota ọnụọgụ 431 100.0 100.0
52
Mmamasụsụ ‘CH’ Mbịa
Mbịakwa Pesenti Pesenti dị
mma Mkpokọba ọnụọgụ pesenti
Ndị emeghị nke ọma
140 32.5 32.5 32.5
Ndị mere nke ọma 291 67.5 67.5 100.0 Mkpakota ọnụọgụ 431 100.0 100.0
Mmamasụsụ ‘D’ Mbịa
Mbịakwa Pesenti Pesenti dị
mma Mkpokọba ọnụọgụ pesenti
Ndị emeghị nke ọma
138 32.0 32.0 32.0
Ndị mere nke ọma 293 68.0 68.0 100.0 Mkpakota ọnụọgụ 431 100.0 100.0
Mmamasụsụ ‘E’ Mbịa
Mbịakwa Pesenti Pesenti dị
mma Mkpokọba ọnụọgụ pesenti
Ndị emeghị nke ọma
82 19.0 19.0 19.0
Ndị mere nke ọma 349 81.0 81.0 100.0 Mkpakota ọnụọgụ 431 100.0 100.0
Nchịkọta Nke dị mma Nke furu efu Mgbakọta ọnụọgụ Ụlọ akwụkwọ
431 100.0% 0 0% 431 100.0%
Ụlọ Akwụkwọ Ndị emeghị nke ọma
ọnụọgụ pesenti n’ụlọ akwụkwọ
Obodo mepere emepe
Ime obodo Mgbakọta ọnụọgụ
68 123 91 Ndị mere nke ọma
ọnụọgụ 124 116 240
Mgbakọta ọnụọgụ
ọnụọgụ pesenti
192 239 431
53
Nchịkọta Nke dị mma Nke furu efu Mgbakọta ọnụọgụ ọnụọgụ Pesenti ọnụọgụ Pesenti ọnụọgụ Pesenti Mmamasụsụ Jenda
431 100.0% 0 0% 431 100.0%
Mmamasụsụ Jenda Krọstabuleshọn Jenda Ụmụ Nwoke Ụmụ
Nwaanyị Mkpakọta Ọnụọgụ
Ndị emeghị nke ọma
ọnụọgụ pesenti
134 55.5%
45 23.6%
191 44.3%
Ndị mere nke ọma
ọnụọgụ pesenti
106 76.4%
146 44.5%
240 55.7%
Mgbakọta ọnụọgụ
ọnụọgụ pesenti
240 100.0%
191 100.0%
431 100.0%
Nkọwa ‘A’ – ‘E’ Ọnụọgụ Obere Etiti Pesenti Mmamasụsụ Nkeji A 431 1.00 2.00 0.30 Mmamasụsụ Nkeji B 431 1.00 2.00 0.20 Mmamasụsụ Nkeji C 431 1.00 2.00 0.60 Mmamasụsụ Nkeji D 431 1.00 2.00 0.75 Mmamasụsụ Nkeji E 431 1.00 2.00 0.90
Mmamasụsụ Ndị na-asụ Asụsụ Igbo Nke dị mma Ndị furu efu ọnụọgụ Pesenti Mmamasụsụ ndị na-asụ Igbo
431 100.0% 0 0% 431 100.0%
Mmamasụsụ ndị na-asụ Igbo Krọstabuleshọn Ndị na-asụ Igbo Ndị emeghị
nke ọma Ndị mere nke ọma
Mgbakọta ọnụọgụ
Ndị emeghị nke ọma ọnụọgụ pesenti
189 43.9%
2 5%
191 44.3%
Ndị mere nke ọma ọnụọgụ pesenti
19 4.4%
221 51.3%
240 55.7%
Mgbakọta ọnụọgụ ọnụọgụ pesenti
208 48.3%
223 51.7%
431 100.0%
54
EDESIBỊA
Agbedo, C. U. (2000). General Linguistics. An Introduction Reader.Nsukka: ACE Resources Konsult Nsukka.
Allerton, D. J. (1969). Essentials of Grammar Theory. A Consensus View of
Syntax Morphology. London: Routledge and Kegan, Paul Anọlue M. Na Chime B. (1998). “Strategies for Improving Teaching and Learning
of Igbo Language in Secondary in Nnewi Local Government Area of Anambra State”. Unpublished B.A, Project Report, University of Nigeria, Nsukka.
Anyanwu, M. (1986). “Igbo in the New Political Education, Pedagogical Problems
and Suggestion”. A Seminar on National Symposium on Igbo Language Policy, University of Nigeria, Nsukka. August 18-31.
Ayara, E. U. Eze A. & Enwe, D. (1996). Factors Affecting Effective Teaching of
Igbo Language in Primary and Secondary Schools in Nsukka Education Zone. Unpublished B.A. Project Report, University of Nigeria, Nsukka.
Azikwe, U. (1998). Language Teaching and Learning, Onitsha: Africana- FEP
Limited. Balden, U. F. (2003). Better Language Learning and Teaching. Nsukka: Fulladu
Publication Company. Basden, N. O. (2008). Language Learners and Their Errors: London: Macmillian. Bloomfield, L. (1933). Language. New York: Holt, Rinehart & Winston. Brooks, N. (2006). Language and Language Learning: Theory and Practice. New
York: Harcourt Brace and World. Brown, E. K. (1991). “Government and Binding Framework”: In K.Malmkjaer
(Ed.) Linguistics Encyclopedia. London: Routledge. Chief Examinars Reports (2008). The West African Senior School Certificate
Examinations. Yaba: West Africa Examination Council. Chief Examinars Reports (2009). The West African Senior School Certificate
Examinations.Yaba: West Africa Examination Council.
55
Chomsky, N. (1957). Syntatic Structures. The Haugue: Mouton. Emenanjo, E.N. (1978). Element of Mordern Igbo Grammar. Ibadan: Oxford
University Press. Enyemonu, P. O., Ime, J. N. & Ogaama, S. A. (1994). “An Investigation on Igbo
Language Performance in Rural and Urban Areas in Nsukka Education Zone”. Unpublished B.A. Project Report, University of Nigeira, Nsukka.
Ekechukwu, J. E. (1990). “The Study of Problems Facing the Teaching and
Learning of Igbo Language in Secondary Schools in Umuahia Urban Education Zone” .Unpublished B.ED Project Report, University of Nigeria, Nsukka.
Ekechukwu, J.E. (2004). “The Study of the Problem Facing the Teaching and
Learning of Igbo Language in Secondary Schools Zone”, Unpublished BED Thesis.
Ewelum, C. & Eze, U. (2003). “Problems encounter by Student in writing of
essay in secondary school in Nsukka Local Government Area”. Unpublished B.A. Project Report, University of Nigeria, Nsukka.
Ezeuko, R. (2000). “Students Problems in Writing Igbo Essays in Secondary
Schools”. Unpublished B.Ed. Thesis, University of Nigeria, Nsukka. Ezikeojiaku, P. A., Ikekeọnwụ, C., Ubani, A. & Ugoji, J. (1999). Fọnọlọji na
Grama Igbo.Nsukka: University Press PLC. Federal Republic of Nigeria (2004). National Policy on Education. Lagos: Federal
Ministry of Information. Fedinard de Saussure (1995). Langauge and Society, London, Fontana. Hartzeler, J.O. (1965). A Sociology of Language. New York: Random House. Honrby, A. S. (1998). New Encyclopadia Britanica. New York: Winston INC. Ikekọnwụ, C.U. (2007). Fọnọlọji na Grama Igbo. University Press P.c.
56
Ilogu, E. (1974) Christianity and Igbo Culture. New York: NOk Publishers: In I.U. Nwadike 2002.
Ingram, D. (1989). First Language Acquisition: Method, Description and
Explanation, Cambridge. University Press. Kirkpatrick, C. (2003). English as Second and Foeriegn Language. London,
Edward Arnold. Lenneberg, E. (1969). “On Explaining Language”: Science, Vol. 164 (3880): 635-
43. Lyons, J. (1981). Language and Linguistics; an Introduction. Cambridge:
University Press. Mehren, W. A & Lehmann, J. T. (1978). Measurment and Evaluation in
Education and Psychology (2nd ed.). New York: Hold, Reinhart and Winston Inc.
Mgbodile, T. O, (1999). Fundamental of Language Education: Nsukka: Mike
Social Press. Naldman, D.E. (1971). Langauge and Social Networks, Oxford. Basil Blackwell. Nwadike, I. U. (2002). Igbo Language in Education; an Historical Study.Onitsha:
Pacific Publishers. Nworgu, B. G. (1991). Educational Research Basic Issues and Methodology.
Ibadan: Wisdom Publishers. Ọfọmata,C.E. (2003), Ndezu Ụtọasụsụ Igbo Nke Ndị Junịọ Sekọndịrị. Enugu:
Format Publishers. Okechukwu, J. E. (1990). “The Study of Problems Facing the Teaching and
Learning of Igbo Language in Secondary Schools in Umuahia Urban Education Zone”. Unpublished B. ED Project, University of Nigeria, Nsukka.
Okonkwo, M.N. (1977). A Complete Course in Igbo Grammar. Onitsha:
Macmillan Nigeria Publishers.
57
Omeje, C. U. (1998). “ The Effects of Project Method on Secondary School Students’ Achievement in Writing Composition in Igbo Language in Nsukka Educational Zone”. Unpublished BA Project Reports, University of Nigeria, Nsukka.
Ọraka, L.N. (1983). The foundation of Igbo Studies. Onitsha: University
Publishing Company. Oruchalu, S.U. (1989). Fundamental of Igbo Spelling. Ihiala: Deo Gratias Press. Otagburuagu, E. J., Obah, T. Y., Onuigbo, S. M. & Okorji, R. I. (2007). Teaching
English Language Skills. A Foundation Linguistics. Nsukka: Any-Pond Sons Printing Press.
Skinner, B.F.(1957). Verbal behaviour. New York: Appeton Crofts. Taiwo, W. (2000). Teaching Foreign Language Skills. Chicago: The University of
Chicago Press. Trudgill, P. (1974). The Social Differentiation of English in Norwish. London:
C.U.P. Ubahakwe, E. (2004). “Goals in English Language”. Journal of Nigeria English
Studies Association 6 (2). Pp. 66 - 68. Uchendu, V. C. (1965). The Igbo of Southeast Nigeria. London: Holt, Rinehart &
Winston. Umo, C.U.(2001). “Teachers’ and Students’ Perception of Source of Poor
Performancing in Senior Secondary Certificate Examination in Igbo Language”. International Journal of Arts and Technology Education, Vol.3. Pp.23 - 24.
Utazị, D.O. (1998). Ndọrọndọrọ ọtọgrafịị Igbo. Nsụkka Nigeria. Wale, J.S. (1999). Principle and Practices of Education. Hong: Sheek Wah Tong Printing Press.
58
Ward, I. C. (1941). Igbo dialets and the Development of a Common Language.
Cambridge: Heffer & Sons Ltd. Williams, D. (2001). English Language teaching. An Integrated Aproach. Ibadan:
Spectrum Books Ltd. Wolfram, W. & Fasold, R.W. (1974). The Study of Social Dialets in American
English. Englewood Cliffs: Prentice-Hall.
59
APPENDIX B
LOCAL GỌỌMENTI
SKUULU EBE JENDA M F TOTAL
Nsụka
A B C D
STC NHS QUEENS St. Cyprian Girls
Obodo mepere emepe ” ” ”
M M F F
51 51 - -
- - 51 50
51 51 51 50
203
Igbo-Etiti E F G
Aku Boys CSS Ohebe Dim CSS Ohodo
Ime Obodo ” ”
M Ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ”
51 25 26
- 26 25
51 51 51
153
Ụzọ-Ụwanị H I
USS Adani Ugbene Ajịma
” ”
” ”
26 25
25 26
51 51
102
Total 255 203 458 458
60
APPENDIKS D Nsogbu hem na ịkpaoke indices
Nsogbụ hem index
Fọmụla = PX 1
100
TR
ebe R = ọnụọgụ ndị lere ule nwe nweta ansa dị mma
T = ọnụọgụ ndị lere ule
Items
1. 0.50 26 0.51
2. 0.54 27 0.65
3. 0.61 28 0.53
4. 0.59 29 0.57
5. 0.53 30 0.47
6. 0.59 31 0.41
7. 0.61 32 0.55
8. 0.53 33 0.39
9. 0.49 34 0.52
10. 0.39 35 0.52
11. 0.44 36 0.61
12. 0.56 37 0.58
13. 0.43 38 0.51
14. 0.41 39 0.42
15. 0.43 40 0.43
16. 0.52 41 0.39
61
17. 0.45 42 0.46
18 0.36 43 0.57
19. 0.40 44 0.42
20. 0.48 45 0.39
21. 0.53 46 0.48
22. 0.59 47 0.46
23. 0.61 48 0.58
24. 0.54 49 0.57
25. 0.51 50 0.61
62
APENDIKS E
NSOGBU HEM INDICES
Fọmụla =
n
Lu
21
Ebe u = bụ ọnụọgụ ụmụ akwụkwọ akara ha gbagotere zatara ajụjụ nke ọma.
L = ọnụọgụ ụmụ akwụkwọ akara ha pere mpe zatara ajụjụ nke ọma.
N = ọnụọgụ ụmụ akwụkwọ ndị akara ha gbagatere na ndị akara ha pere mpe
1. 0.39 26 0.43
2. o.42 27 0.47
3. 0.60 28 0.35
4. 0.41 29 0.46
5. 0.64 30 0.49
6. 0.55 31 0.39
7. 0.48 32 0.41
8. 0.57 33 0.37
9. 0.61 34 0.47
10. 0.51 36 0.41
11. 0.41 36 0.51
12. 0.47 37 0.61
13. 0.37 38 0.57
14. 0.41 39 0.48
15. 0.39 40 0.42
16. 0.49 41 0.41
63
17. 0.46 42 0.47
18. 0.35 43 0.39
19 0.47 44 0.49
20. 0.48 45 0.54
21. 0.54 46 0.44
22. 0.61 47 0.43
23. 0.45 48 0.58
24. 0.59 49 0.54
25. 0.54 50 0.61
64
APENDIKS F
Ịmata akara bịara ugboro ugboro na nnwale Mmụta Asụsụ Igbo anyị ga-eji K-R 20 wee
mara.
Fụmụla r =
211 Sx
pqn
n
Ebe n = ọnụọgụ ajụjụ ajụrụ
P = ụmụ akwụkwọ zatara ajụjụ nke ọma
Q = ụmụ akwụkwọ a zataghị ajụjụ nke ọma
(q = 1- p)
= mkpọta ọnụ akara n’egosi ma pq jikọtara ọnụ na ajụjụ niile ajụrụ.
Sx2 = mgbakọta ọnụ ajụjụ niile ajụrụ.
Ọnụ ọgụgụ ajụjụ = iri ise
Ụmụ akwụkwọ zara ajụjụ = iri abụọ
pq = 5.32
Sx2 = 47.04
Ya bụ otu esi nweta r =
04.4732.511
5050
= 1.02 0.89
r 0.91
65
EBUMNUCHE
Ebumnuche ihe ọmụmụ a bụ ịmata Mmeta Ọfụma N’ụtọasụsụ Igbo N’ule
Sekọndịrị: Ntule ule ụmụ akwụkwọ asụmabụọ na zonu mmụta Nsụka dị Na Steti
Enugwu.
Ihe ọmụmụ a chọpụtara:
a. Ụmụ akwụkwọ na-asụ asụsụ Igbo dịka asụsụ epum ha si eme nke ọma
n’ụtọasụsụ.
b. Jenda na-emetụta mmebe nkeọma n’ule asụsụ Igbo.
ch. Akụkụ asụsụ Igbo na-enye ụmụ akwụkwọ nsogbụ.
d. Akụkụ asụsụ Igbo ụmụ akwụkwọ na-eme nkeọma na ya.
e. Ndịmịịche dị na nzata ndị bi n’ime obodo na obodo meperre emepe n’ihe gbasara
ụtọasụsụ.
AJỤJỤ NCHỌCHA
Ajụjụ nchọcha bụ ihe nyere aka maka ihe ọmụmụ a:
a. Kedu ka ụmụ akwụkwọ na-asụ Igbo dịka epum ha si eme nkeọma n’ụtọasụsụ?
b. Mpaghara ụtọasụsụ ụmụ akwụkwọ ka enwekarị nsogbụ.
ch. Mpaghara ụtọasụsụ nke ụmụ akwụkwọ ka eme nkeọma.
d. Mpaghara ndimịịche jenda n’ụtọasụsụ.
e. Ụmụ akwụkwọ ka eme nkeọma n’ụmụ akwụkwọ ime obodo mepere emepe?
66
DIZAỊN ỌMỤMỤ
Dizaịn ọmụmụ a bụ ex-post facto design. Dezaịn a bụ udị n’enye aka mmekọrịta
kos-ịfekịtị mana a bịa dịka nkọwa Nwogu (1991) onye nchọcha e nweghị nchịkwa n’ihe
gbasara mgbanwe ihe ọmụmụ ma ọ nweghị ike mgbanwo ha. Ihe onye nchọcha mere bụ
ijiko myiwere dibu adị ma lebee anya n’ụfọdụ ihe ga-enye aka n’ihe ọmụmụ.
A bịa n’ihe ọmụmụ a onye nchọcha lebere anya na nkọwa mmeta nkeọma n’ụtọasụsụ
Igbo n’ule sekondịrị. Ya bụ mgbanwe ụtọasụsụ ụmụ akwụkwọ sekondịrị skuulu Igbo
abughị ihe a na-akọ n’ọnụ kama ọ bụ ihe ngosi mmeta nkeọma n’ụtọasụsụ.
USORO NTỤCHA DATA
Data eji nweta ihe ọmụmụ a bụ ntụcha akara na usoro Igbo izugbe. Ngbakọta
ajụjụ dị iri ise n’ọnụọgụ. Otu akara ka e nyere nwata ọ bụla zatara ajụjụ n’ime iri ise.
Akara min ka eji zaa ajụjụ nchọcha. Akara karịrị iri ise ka a nabatara ma nke pekarịrị iri
ise ka ama nabata.
67
NNWALE MMATA ASỤSỤ IGBO
Nkeji A
Tinye okwu dabara adaba n’oghere ndị a site n’iwere okwu ndị a dị na mgachi: [na,
na-, n’, ga-, ka kwa]. Ịma atụ:
Udo na ọnwụ ka anyi ji aga
a. Ngọzị ha bi ________ Aba.
b. Nna m ________ arụ ọrụ Bekee.
ch. Ulọ akwụwkọ anyị ________ ka nke ha mma.
d. Nne _______ aga ahịa echi.
e. Anyị bi ______ Nsụka.
f. Ji _______ ede bụ ihe oriri.
g. ________ Sọnde ọ bụla bụ iri osikapa.
h. Azụ n’ebi _________ mmiri.
i. Anyị _______ ede asụsụ Bekee kwa ụtụtụ ọ bụla n’ụlọ akwụkwọ anyi.
j. Anu dị ______ ite ofe.
Nkej B
Họrọ nke e tinyetara akaraụda ya ndị a.
1. Aka (Akụkụ ahụ)
a. áká
b. ákà
ch. Àkà
68
2. Egbe (udị nnụnụ)
a. égbè
b. égbé
c. ègbé
3. Akpa (ngwa e ji etinye ihe)
a. àkpà
b. ákpā
ch. ákpá
4. Ego (okpogho)
a. égò
b. égó
ch. égō
5. Egwu (ụjọ)
a. égwù
b. égwū
ch. ègwù
6. Ede (udi akụkụ)
a. édé
b. édē
ch. édè
7. Igbe (ngwa ntinye)
a. ígbé
b. ígbè
69
ch. ígbē
8. Isi (ime ka ihe ghee)
a ísì
b ísí
ch. ísī
9. Aja (ihe mmeputa ala)
a. ájā
b. àjà
ch. ájá
10. Mma (iheọma)
A mà
b mā
ch má
Nkeji ch
Họrọ nke e dezịrị nkeọma
1. a niile
b nile
ch nilee
2. a nwanyị
b nwaanyị
ch nwaanyịị
3. a ọrka
b ọwka
70
ch ọka
4 a ọrlụ
b ọlụ
ch ọlụụ
5. a ọkwụnanọ
b ọkụnanọ
ch awkụnanọ
6. a ọwgụ
b ọgụ
ch ọgwụ
7. a ọnitcha
b ọnicha
ch ọnisha
8. a owere
b owerri
ch oweri
9. a myọ
b nyọ
ch nnyọ
10. a nra
b mbọ
ch nvọ
71
Nkeji D
Si, na ‘a’, ‘b’, ‘na’, ‘ch’, dị n’okpuru ederede a họrọ nke dabara adaba
1 Ụdaume bụ
a mkpụrụ edemede ọ bụ a na-akpọpụta ha, ha nwe ụda
b mkpụrụ edemede ọ bụ a na-akpọpụta ha, ha agaghị enwe ụda
ch mkpụrụ ededemede ọ bụ a na-akpọpụta ha, ha-adapụ adapụ
2 Ụdaume Igbo dị
a isii
b itoolu
ch asatọ
3 Mgbochiume bụ
a mkpụrụ edemede enweghị ụda mgbe a na-akpọpụta ha
b mkpụrụ edemede nwere ụda mgbe a na-akpọpụta ha
ch mkpụrụ edemede nwere mgbanwo mgbe a na-akpọpụta ha
4 Mgbochiume gbara mkpị dị
a iri
b asatọ
ch itoolu
5 Myiri ụdaume dị
a atọ
b abụọ
ch anọ
6 Myiri ụdaume na ụdaume yiri onwe ha na
72
a ụdaume na-enwe ụda ma myiri ụdaume anaghị enwe ụda.
b ha abụọ enweghị ụda.
ch ha na-enwe ụda ma a na-akpọpụta ha.
7 Asipekịtị bụ
a otu dị n’ụtọasụsụ anaghị arụtụ aka mgbe ihe jiri mee maọbụ oge
ihe mere.
b na-arụtụ aka mgbe oge ihe mere na mgbe o jiri mee.
ch na- arụtụ aka naanị mgbe ihe jiri mee.
8 Tensị bụ otu n’ime ụtọasụsụ Igbo
a na-akọwa mgbe ihe mere ma o bụ oge o jiri mee.
b anaghị akọwa mgbe ihe jiri mee.
ch na-egosi onwe ya nke ọma n’ahịrịokwu.
9 Asịpekịtị atọ e nwere n’asụsụ Igbo bụ
a asịpekịtị mmaahụ, asịpekịtị ngawanye na asịpekịtị mmemmadụ.
b asịpekịtị nnọnonwe, asịpekịtị mmecha na asịpekịtị mmaahụ.
ch asịpekịtị mmaahụ, asịpekịtị ngawanye na asịpekịtị mmecha.
10 Ndịmiche dị na asịpekịtị na tensị bụ
a asịpekịtị na-arụtụ aka mgbe ihe na-eme ma tensị anaghị arụtụ aka
mgbe ihe na-eme
b asịpekịtị anaghị akọwa onwe ya ma tensị na-akọwa onwe ya.
ch asịpekịtị anaghị arụtụ aka oge ihe na-eme ma tensị na-arụtụ aka
mgbe ihe mere na oge o jiri mee.
73
Nkeji E
Si na ‘a’, ‘b’, na ‘ch’ họrọ okwu dabara zaa ajụjụ ndị a
1 Mọfịm bụ ____________________________________________
a irighiri na irighiri na-adị n’okwu a gaghị enwe ụzọ ọzọ a ga-esi
kerie ha ka ha nwe nghọta n’asụsụ ọ bụla.
b irighiri na irighiri na-adị n’okwu a ga-ekeri ka ha nwee nghọta
n’asụsụ.
ch irighiri na irighiri okwu dị ọtụtụ ma nwee nghọta.
2 Ụdị mọfịm e nwere dị______________________________________
a atọ
b abụọ
ch otu
3 Mọfịm ahụ bụ _______________________________________________
a mọfịm nnọrọonwe na mọfịm njiko.
b mọfịm ndabe na mọfịm nghọta.
ch mọfịm nnọrọonwe na mọfịm ndabe.
4 Mọfịm nnọrọonwe bụ _________________________________________
a mọfịm na-adị abụọ.
b mọfịm na-achọ enyemaka mọfịm ọzọ.
ch mọfịm achọghị enyemaka mọfịm ọzọ.
5 Mọfịm ndabe bụ _____________________________________________
a mọfịm na-achọ enyemaka mọfịm ọzọ mgbe ha na-achọ imebe
okwu.
74
b mọfịm achọghị enyemaka mọfịm ọzọ n’imebe okwu.
ch mọfịm na-akwụrụ onwe ya mgbe a na-emebe okwu.
6 Mọfịm nnọrọonwe atọ ị mara bụ _______________________________
a ri, iri.
b ta, tara.
ch de, dere.
7 Nke bụ mọfịm ndabe bụ _______________________________________
a dere.
b ma.
ch je
8 Mọfịm ole dị okwu a?
‘Ri’
a otu mọfịm.
b mọfịm abụọ.
ch mọfịm atọ
9. Rie
a mọfịm abụọ.
b mọfịm atọ.
ch otu mọfịm.
10. Ọkụkụ
a mọfịm abụọ
b otu mọfịm
ch mọfịm atọ
75
EBUNUCHE
Ebunuche ihe ọmụmụ a bụ ịmata mmeta nkeọma n’ụtọasụsụ Igbo n’ule sekọndịrị:
Ntule ule ụmụ akwụkwọ asụmabụọ na zonu mmụta Nsụka dị na Steti Enugwu.
Ihe ọmụmụ a chopụtara:
a Ụmụ akwụkwọ na-asụ asụsụ Igbo dịka epum ha si eme nke ọma
n’ụtọasụsụ.
b Jenda a na-emụtụta mmebe nkeọma n’ule asụsụ Igbo.
ch Akụkụ asụsụ Igbo na-enye ụmụ akwụkwọ nsogbu.
d Akụkụ asụsụ Igbo ụmụ akwụkwọ na-eme nke ọma na ya.
e Ndịmiche dị na nzata ndị bi n’ime obodo na obodo mepere emepe n’ihe
gbasara ụtọasụsụ.
AJỤJỤ NCHỌCHA
Ajụjụ nchọcha bụ ihe nyere aka maka ihe ọmụmụ a:
a Kedu ka ụmụ akwụkwọ na-asụ Igbo dịka epum ha si eme nke ọma
n’ụtọasụsụ?
b Kedu mpaghara ụtọasụsụ ụmụ akwụkwọ ka enwekarịrị nsogbu?
ch Kedu mpaghara ụtọasụsụ ụmụ akwụkwọ ka-eme nke ọma?
d Kedu mpaghara ndịmiche jenda n’ụtọasụsụ?
e Kedu ụmụ akwụkwọ ka eme nke ọma n’ụmụ akwụkwọ ime obodo na
obodo mepere emepe?
76
ATỤMATỤ ỌMỤMỤ
Atụmatụ ọmụmụ a bụ ex-post facto atụmatụ. Atụmatụ a bụ ụdị n’enye aka
mmekọrịta kọs-ịfekịtị mana a bịa dịka nkọwa Nworgu (1991), onye nchọcha e nweghị
nchịkwa n’ihe gbasara mgbanwe ihe ọmụmụ ma o onweghị ike mgbanwo ha. Ihe onye
nchọcha emere bụ njiko myiwere dibu adị maọbụ lebee anya n’ụfọdụ ihe nyere aka n’ihe
ọmụmụ.
A bịa n’ihe ọmụmụ a onye nchọcha chọrọ ka ya lebee anya na nkọwa mmeta nke
ọma n’ụtọasụsụ Igbo n’ule sekọndịrị. Ya bụ mgbanwe ụtọasụsụ ụmụ akwụkwọ sekọndịrị
skuulu Igbo a bụghị ihe a ga na-akọ n’ọnụ kama ọ bụ ihe ngosi mmeta nke ọma
n’ụtọasụsụ
USORO NTỤCHA DATA
Data a ga-eji nweta ihe ọmụmụ a bụ ntụcha akara na usoro Igbo izugbe. Ngbakọta
ajụjụ dị iri ise n’ọnụọgụ. Otu akara ka e nyere nwata ọ bụla zatara ajụjụ n’ime iri ise.
Akara min bụ ihe eji zaa ajụjụ nchọcha. Akara karịrị iri ise ka a nabatara ma nke pekarịrị
iri ise ka ama nabata.